Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 20:1 - Bible Nso

1 Onye nākwa emò ka manya-vine bu, onye-nkpọtu ka ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya bu; Onye ọ bula nke nāwaghari site na ya amaghi ihe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Mmanya bụ onye na-akwa emo. Onye mkpọtụ ka ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya bụ. Onye ọbụla kwere ka ha duhie ya bụ onye nzuzu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 20:1
21 Iomraidhean Croise  

Devid we kpọ ya, o we rie ihe n'iru ya, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu; Devid we me ya ka ọ ṅubiga manya okè: o we pua n'anyasi idina n'ihe-ndina-ya n'etiti ndi-orù onye-nwe-ya, ma ọ ridaghi rue ulo-ya.


Absalom we nye ndi-orù-ya iwu, si, Biko, lezienu anya. mb͕e obi Amnon di nma na manya-vine; mb͕e m'si kwa unu, Tibuenu Amnon, menu ka ọ nwua, unu atula egwu: ọ̀ bughi na mu onwem enyewo unu iwu? dinu ike, buru-kwa-nu ndi-dìnkpà.


Anọla n'etiti ndi nāṅubiga manya-vine ókè; N'etiti ndi nēribiga anu ókè:


Ka ndi-eze ghara iṅu manya-vine, Lemuel, ka ndi-eze ghara iṅu manya-vine; Ka ndi-isi ghara kwa isi, Òle ebe ka ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya di?


Ma ọbuná ndia adaghariwo site na manya-vine, ọ bu kwa site n'ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ka ha ṅaghariworo; onye-nchu-àjà na onye-amuma adaghariwo site n'ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, manya-vine elodawo ha, ha aṅaghariwo site n'ihe-ọṅuṅu nābà n'anya; ha adaghariwo n'ọhuhu, ha asuwo ngọngọ n'ihe nile ekpere n'ikpe.


Ahuhu gādiri ndi nēbili n'isi-ututu ib͕aso ihe-ọṅuṅu nābà n'anya; ndi nānọ ogologo mb͕e n'anyasi, manya-vine ewe me ka aru nwuru ha ọku.


Ahuhu gādiri ndi-dike n'iṅu manya-vine, ndi bu kwa dìnkpà n'itigwa ihe-ọṅuṅu n'anya:


Ha si, Bianu, ka m'weta manya-vine, ka ayi ṅubiga kwa ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ókè; echi gādi kwa ka ta, ubọchi di uku gabiga ókè nke-uku.


Ikwa-iko na manya-vine na manya-vine ọhu nēwepu obi amam-ihe.


N'ubọchi eze-ayi ndi-isi jiri idi-ọku nke manya-vine ria ọria; o soro ndi nākwa emò setia aka-ya.


Aṅula manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, gi onwe-gi, na umu-gi ndikom tiyere gi, mb͕e unu nābà n'ulo-ikwū nzute, ka unu we ghara inwu; ọ gābu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile:


E, ọzọ kwa, n'ihi na manya-vine-ya bu ihe-nghọb͕u, nwoke di nganga ka ọ bu nke nādighi-anọ kwa n'ulo; onye meworo ka ọchichọ-nkpuru-obi-ya sa mbara dika ala-mọ, ya onwe-ya di kwa ka ọnwu, afọ adighi-eju kwa ya, o we me ka mba nile zukọta n'ebe ọ nọ, ọ nāchikọta kwa ndi nile di iche iche n'ebe ọ nọ.


ma-ọbu ndi-ori, ma-ọbu ndi-anya-uku, ma-ọbu ndi nāṅubiga manya ókè, ma-ọbu ndi-nkwutọ, ma-ọbu ndi nāpunara madu ihe, ha agaghi-eketa ala-eze Chineke.


ikpọ-asì, iṅubiga-manya-ókè, ite-egwú, na ihe yiri ihe ndia: nke m'buru uzọ gwa unu, dika m'buru uzọ gwa unu n'oge gara aga, na ndi nēme ihe di otú a agaghi-eketa ala-eze Chineke.


Unu aṅubiga-kwa-la manya ókè, nke ndu ila-n'iyì di nime ya, kama juputanu na Mọ Nsọ;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan