Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 2:22 - Bible Nso

22 Ma ndi nēmebi iwu ka agēbipu n'uwa, Ọ bu kwa ndi nāghọ aghughọ ka agēropu na ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ site nʼala ahụ, ọ bụkwa ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi ka a ga-ewezuga na ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 2:22
20 Iomraidhean Croise  

Jehova gēme kwa ka otù eze Israel biliere Ya, onye gēbipu ulo Jeroboam ubọchi a: ma gini? ọbuná ub͕u a.


Sọl we nwua n'ihi nmekpu-ya o mekpuru megide Jehova, n'ihi okwu Jehova, nke ọ nēdebegh: ọzọ kwa, n'ihi na ọ juru ase n'aka onye nwere mọ ọ nāju ihe, iji ya ju ase,


Na ọ bu rue ubọchi nhuju-anya ka anēb͕ochi onye ọjọ? Na ọ bu rue ubọchi ọnuma ka anēdupu ha?


Ka eme ka ndi-nmehie si n'uwa gwusia, Ka ndi nēmebi iwu ghara kwa idi ọzọ. Gọzie Jehova, nkpuru-obim. Tonu Ja.


Jehova nēdebe ndi nile nāhu Ya n'anya; Ma ndi nile nēmebi iwu ka Ọ gēkpochapu.


N'ihi na ndi nēmebi iwu gāla n'iyì, Ndi-iro Jehova gādi ka ihe di oké ọnu-ahia nke umu-aturu: Ha gēdè; n'anwuru-ọku ka ha gēdè.


N'ihi na ndi Ọ nāgọzi gēnweta ala; Ma agēbipu ndi Ọ nākọcha.


N'ihi na Jehova nāhu ezi ikpé n'anya, Ọ dighi-arapu kwa ndi-ebere-Ya; Rue mb͕e ebighi-ebi ka anēdebe ha: Ma agēbipu nkpuru ndi nēmebi iwu.


Chineke gākwatu kwa gi rue mb͕e ebighi-ebi, Ọ gējide gi, dọkpupu gi n'ulu-ikwū-gi, Ropu kwa gi n'ala ndi di ndu. Selah


Le, nwoke nke nādighi-eme Chineke ebe-ya siri ike; Kama ọ tukwasiri obi n'uba nke àkù-ya, Ọ di ike n'ọchichọ ọjọ ya.


Agaghi-ewezuga onye ezi omume n'ọnọdu-ya rue mb͕e ebighi-ebi: Ma ndi nēmebi iwu agaghi-ebi n'uwa.


Izu-okè nke ndi ziri ezi nēdu ha: Ma omume b͕agọrọ nke ndi nāghọb͕u aghọb͕u gēmebi ha.


Jehova agaghi-ekwe ib͕aghara ya, kama mb͕e ahu iwe Jehova na ekworo-Ya gākwu anwuru-ọku imegide nwoke ahu, ọb͕ub͕a-iyi nile edeworo n'akwukwọ a gāmakpu kwa n'aru ya, Jehova gēhichapu kwa aha-ya n'okpuru elu-igwe.


Jehova we ropu ha n'ala-ha n'iwe, na'ọnuma, na n'oké iwe, we tubà ha n'ala ọzọ, otú ọ di ta.


Ma Jehova, bú Chineke-gi, gēwepu mba ahu n'iru-gi nke-ntà nke-ntà: i pughi ime ka ha gwusia ngwa ngwa, ka anu-ọhia ghara iba uba megide gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan