11 Ìzùzù ganēche gi nche, Nghọta gēchebe gi:
11 Izuzu zuruoke ga-echebe gị, nghọta ga na-eche gị nche.
Ka izu-okè na izi-ezi chezim, N'ihi na elewom anya Gi.
Inye ndi nēnweghi uche ezi uche, Inye nwa-okorọbia ihe-ọmuma na ìzùzù:
Arapula ya, ọ gēdebe kwa gi; Hu ya n'anya, ọ gēchebe kwa gi.
Ọ buru na ígwè anyua nkọ, ma onye ahu amughi iru-ya amu, ọ gētiye kwa ike kari: ma amam-ihe nāba urù ime ka ihe nāgazi agazi.
Ya mere lezienu anya nke-ọma otú unu nējeghari, ọ dighi ka ndi nāmaghi ihe, kama dika ndi mara ihe;