10 N'ihi na amam-ihe gābà n'obi-gi, Ihe-ọmuma gādi kwa nkpuru-obì-gi utọ;
10 Nʼihi na amamihe ga-enwe ọnọdụ nʼime obi gị, ihe ọmụma ga-adịkwa mkpụrụobi gị ụtọ.
Adighm-apu kwa n'ihe enyere n'iwu nke eb͕ub͕ere-ọnu-Ya; Atukọbawom okwu nile nke ọnu-Ya kari òkèm.
Ka ntughari-uchem tọ Ya utọ: Mu onwem gāṅuri ọṅu nime Jehova.
Le ka okwu-ọnu-Gi si atọ okpo-ọnum utọ! Ha nātọ ọnum utọ kari manu-aṅu.
Eketawom ihe-àmà-Gi nile rue mb͕e ebighi-ebi; N'ihi na ihe nātọ obim utọ ka ha bu.
Obi nātọ mu onwem utọ n'ihi okwu-ọnu-Gi, Dika onye nāhuta ọtutu ihe-nkwata.
Le ka m'si hu iwu-Gi n'anya! Ogologo ubọchi nile ka nke ahu bu ihe m'natughari n'uche.
Ihe anāchọsi ike ka ha bu, kari ọla-edo, e, kari ọtutu ọla-edo anuchara anucha: Ha di kwa utọ kari manu-aṅu bú nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu nātasi.
Inye ndi nēnweghi uche ezi uche, Inye nwa-okorọbia ihe-ọmuma na ìzùzù:
N'obi onye-nghọta ka amam-ihe nānọgide: Ma n'etiti ndi-nzuzu ka ọ nēme ka amara ya.
N'ihi na ọ di utọ mb͕e i debe ha n'afọ-gi, Mb͕e ha gēguzosi ike n'otù n'elu eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua.
Arapula ya, ọ gēdebe kwa gi; Hu ya n'anya, ọ gēchebe kwa gi.
Achọputawo okwu-Gi, m'we rie ha; okwu-Gi we ghọrọm ihe-obi-utọ na ọṅù obim: n'ihi na akpọkwasiwom aha-Gi, Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha.
Kwenu ka okwu Kraist were àkù-ya nile biri nime unu n'amam-ihe nile; werenu abù ọma na ukwe na abù nke Mọ Nsọ nēzírita onwe-unu ihe, nādurita kwa onwe-unu ọdu, nime amara enyere unu nābùnu abù nime obi-unu nye Chineke.