Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 19:8 - Bible Nso

8 Onye nēnweta obi amam-ihe nāhu nkpuru-obi-ya n'anya: Onye nēdebe nghọta gāchọta ezi ihe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Onye na-enweta amamihe hụrụ ndụ nʼanya, onye na-edebekwa nghọta na-enweta ọganihu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 19:8
17 Iomraidhean Croise  

Ọzọ, eji ha dọ orù-Gi aka na nti: N'idebe ha ka ọkpukpu-ọlu riri nne nāputa.


Onye nwere uche n'okwu Chineke gāchọta ezi ihe: Ọzọ, onye nātukwasi Jehova obi, onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu.


N'ìhi gini kwa ka ego-ọzùzù-ahia di n'aka onye-nzuzu izuta amam-ihe, Mb͕e obi amam-ihe nādighi?


Agaghi-agu onye-àmà okwu-ugha n'onye nēmeghi ihe ọjọ; Ọzọ, onye nēkupu okwu-ugha dika ume gāla n'iyì.


N'ihi na ọ di utọ mb͕e i debe ha n'afọ-gi, Mb͕e ha gēguzosi ike n'otù n'elu eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua.


Osisi nēnye ndu ka ọ buru ndi nējide ya aka: E, onye ọ bula nke nējisi ya aka ike bu onye ihe nāgara nke-ọma.


Nwam, ekwela ka ha si n'anya-gi abua wezuga onwe-ha; Chebe nzube-ihe na ìzùzù;


Ha gābu-kwa-ra nkpuru-obi-gi ndu, Bu-kwa-ra olu-gi amara.


Ekwela ka ha si n'anya-gi abua wezuga onwe-ha; Debe ha n'etiti obi-gi.


O we zím ihe, sim, Ka obi-gi jide okwum nile; Debe ihe nile m'nyere n'iwu, we di ndu:


Arapula ya, ọ gēdebe kwa gi; Hu ya n'anya, ọ gēchebe kwa gi.


M'gēnye kwa unu obi ọhu, ọ bu kwa mọ ọhu ka M'gētiye nime unu: M'gēwezuga kwa obi nkume n'anu-aru-unu, nye unu obi nke bu anu-aru.


Onye nāhu ndu-ya n'anya nētufu ya; onye nākpọ kwa ndu-ya asì n'uwa nka gēdebe ya rue ndu ebighi-ebi.


Onye nwere ihe M'nyere n'iwu, nke nēdebe kwa ha, ọ bu onye ahu nāhum n'anya: onye nāhum n'anya, Nnam gāhu kwa ya n'anya, Mu onwem gāhu kwa ya n'anya, were kwa Onwem gosi ya.


N'ihi na, Onye ahu nke nāchọ ihu ndu n'anya, Na ihu ezi ubọchi, Ya me ka ire-ya ghara ikwu ihe ọjọ, Me kwa ka eb͕ub͕ere-ọnu-ya ghara ikwu okwu aghughọ:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan