Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 19:26 - Bible Nso

26 Onye nāpunara nna-ya ihe, nke nēme kwa ka nne-ya b͕alaga, Bu nwa nēweta ihere nēme kwa ka enwe iru-ihere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 Ọ bụ nwa ahụ na-eweta ihere ga-ezu nne na nna ya ohi, maọbụ chụpụ ha site nʼụlọ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 19:26
14 Iomraidhean Croise  

Ilu di iche iche nke Solomon. Nwa nke mara ihe nēme ka nna-ya ṅuria: Ma nwa di nzuzu bu iru-újú nne-ya.


Onye nēkpokọta na mb͕e okpom-ọku bu nwa nēnwe uche: Ma onye nāraru ura n'owuwe-ihe-ubi bu nwa nēweta ihere.


Orù nke nwere uche gāchi nwa madu nēweta ihere, Ọ bu kwa n'etiti umu-nne nwa ahu ka ọ gēkere ihe-nketa.


Ihe nākpasu nna-ya iwe ka nwa nzuzu bu, Ọ bu-kwa-ra nwanyi muru ya ihe-ilu.


Nwam, rapu inu idọ-aka-na-nti Nke nēme ka i si n'okwu-ọnu nile nke ihe-ọmuma waghari.


Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke nātu oké egwu mb͕e nile: Ma onye nēme ka obi-ya sie ike gādabà n'ihe ọjọ.


Onye nānapu nna-ya ma-ọbu nne-ya ihe n'ike, si, Ọ dighi njehie ọ bu; Onye ejikọtaworo ya na onye-nbibi ka ọ bu.


Onye nēdebe iwu bu nwa nāghọta ihe: Ma onye bu eyì ndi nēribiga ihe ókè nētiye nna-ya n'onọdu-ihere.


Ọb͕ọ di nke nākọcha nna-ha, Ha adighi-agọzi kwa nne-ha.


Anya nke nākwa nna-ya emò, Nke nēleda kwa iṅa nne-ya nti, Ugolo-ọma nke ndagwurugwu gāghuputa ya, Umu-ugo gēri kwa ya.


ma mb͕e nwa-gi nka biara, nke ya na ndinyom ndi nākwa iko ripiara ihe nile i ji biri, i b͕uru nwa-ehi azùru azù nye ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan