Absalom na ndikom nile nke Israel we si, Idu-ọdu Hushai, bú onye-Akait, di nma kari idu-ọdu Ahitofel, Ma Jehova nyere iwu imebi ezi idu-ọdu nke Ahitofel, ka Jehova we me ka ihe ọjọ biakwasi Absalom.
ma mb͕e Esta batara n'iru eze, eze ji akwukwọ si ka èchìchè ọjọ ya, nke o chère megide ndi-Ju, ka o chigharikwasi n'isi-ya; ọ si kwa ka akwuba ya na umu-ya ndikom n'elu osisi.
nēgosi ikpe-azu site na mbu, nēgosi kwa ihe nke anēmeghi eme site na mb͕e ochie; nāsi, Ndum-ọdum gēguzosi ike, ọ bu kwa ihe nile nke nātọm utọ ka M'gēme:
Ma nka gāburu unu ihe-iriba-ama, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na Mu onwem nēji nmehie-unu leta unu n'ebe a, ka unu we mara na okwum nile aghaghi iguzosi ike imegide unu ime unu ihe ọjọ:
ma ihe ahu nke nābà nime mọ-unu, ọ gaghi-adi ma-ọli; ọ bu na unu onwe-unu nāsi, Ayi gādi ka mba nile, dika ab͕uru nile nke ala nile, ijere osisi na nkume ozi.
ọ bu kwa ndi nile bi n'uwa ka anāgu n'ihe-efu: ọ bu kwa dika O si achọ ka Ọ nēme n'usu-ndi-agha nke elu-igwe, na n'etiti ndi bi n'uwa: ọ dighi kwa onye gēti aka-Ya ihe, si Ya, Gini ka I meworo?
Nke eme-kwa-ra ayi ka ayi buru ihe-nketa nime Ya, ebe eburu uzọ ka ayi àkà dika Onye ahu zubere, Onye nālusi ihe nile ike dika ìzù nke ọchichọ-Ya si di;
N'ihi na madu ufọdu b͕ebàra, bú ndi ewereworo ha gosi ọra madu mb͕e ochie ka ewe ma ha ikpé a, ndi nādighi-asọpuru Chineke, ndi nāgha amara Chineke-ayi ka ọ buru agu ikwa-iko, ndi nāgọnari kwa Onye nání Ya bu Nna-nwe-ọra, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.