Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 19:1 - Bible Nso

1 Ọ di nma, bú ob͕eye nke nēje ije n'izu-okè-ya, Kari onye eb͕ub͕ere-ọnu-ya b͕agọrọ ab͕agọ n'okwu, onye bu kwa onye-nzuzu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Ọ ka mma ịbụ ogbenye onye kwesiri ntụkwasị obi karịa ịbụ onye nzuzu na-ekwu okwu ụgha mgbe niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 19:1
16 Iomraidhean Croise  

Ma mu onwem, n'izu-okèm ka m'gēje ije: B͕aputam, me-kwa-ram amara.


Ogologo ubọchi nile ka ọ nēme amara, nēbinye kwa ihe; Nkpuru-ya bu kwa ndi agọziri agọzi.


Onye ezi omume nēgosi madu-ibe-ya uzọ: Ma uzọ ndi nēmebi iwu nēme ka ha kpafue.


Onye nēje ije n'izi-ezi-ya nātu egwu Jehova: Ma onye nēsihie n'uzọ-ya nile nēleda Ya anya.


Ọ di nma inwe ihe ntà n'egwu Jehova, Kari inwe ọtutu àkù ma ọb͕ub͕a-aghara adi ya.


Ọ di nma inwe ihe ntà n'ezi omume, Kari inwe ọtutu ihe-omume ma ikpé ziri ezi adighi ya.


Ihe nēme ka anāchọsi madu ike bu ebere-ya: Ọzọ, ob͕eye di nma kari onye-okwu-ugha.


Onye ezi omume nke nējeghari n'izu-okè-ya, Ndi ihe nāgara nke-ọma ka umu-ya nke gānọchi ya gābu.


Ọ di nma, bú ob͕eye nke nēje ije n'izu-okè-ya, Kari onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uzọ-ya abua, ọ bu ezie na onye ahu bu ọgaranya.


Si n'ebe i nọ wezuga ọnu nēkwu ihe b͕agọrọ ab͕agọ, Me kwa ka eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwuhie ekwuhie di anya n'ebe i nọ.


N'ihi na ejiwo ọbara meru aka-unu, ejiwo kwa ajọ omume meru nkpisi-aka-unu; eb͕ub͕ere-ọnu-unu ekwuwo okwu-ugha, ire-unu nātamu ajọ ihe.


N'ihi na ùrù gini ka ọ gābara madu, ma ọ buru na o gērita uwa dum n'urù, ewe napu ya ndu-ya? ma-ọbu ìhe-nb͕anwe gini ka madu gēji b͕anwe ndu-ya?


Ma ub͕u a mara hu kwa ihe i gēme; n'ihi na ezubesiri ihe ọjọ ike megide onye-nwe-ayi, megide kwa ulo-ya nile: ma ya onwe-ya bu nwoke jọb͕uru onwe-ya, nke madu nāpughi igwa ya okwu.


Biko, ka onye-nwem ghara itukwasi obi-ya n'aru nwoke a jọb͕uru onwe-ya, bú Nebal: n'ihi na dika aha-ya si di, otú a ka ya onwe-ya di; Nebal bu aha-ya, ihe-nzuzu di kwa n'aka-ya: ma mu onwem, bú orù-gi nwayi, ahughm umu-okorọbia onye-nwem, ndi i zitere.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan