9 Ọzọ, onye di ume-ngwu n'ije-ozi-ya, Onye ahu bu nwa-nne nke onye-nwe nbibi.
9 Onye dị umengwụ nʼọrụ ya bụ nwanne nke onye mbibi.
M'ghọworo nkita-ọhia nwa-nne, Ghọ-kwa-ra enyi-nnunu eyì.
Ob͕eye ka onye ji ọbu-aka ume-ngwu alu ọlu gābu: Ma aka ndi di nkọ nēme ọgaranya.
Okwu nile nke onye nēkwu okwu-azu di ka iberibe-nri nātọ utọ nke-uku, Okwu ahu aridawo kwa n'ime-ime-ala afọ.
Ume-ngwu nēme ka oké ura dakwasi madu; Ọ bu kwa nkpuru-obi nke di ume-ngwu ka agu nāgu.
Onye nānapu nna-ya ma-ọbu nne-ya ihe n'ike, si, Ọ dighi njehie ọ bu; Onye ejikọtaworo ya na onye-nbibi ka ọ bu.
Ma onye-nwe-ya zara, si ya, Ajọ orù nke di ume-ngwu, i matara na anamewe ihe ubi n'ebe m'nāghaghi nkpuru, nāchikọputa kwa n'ebe m'nāfuchaghi;
n'akuku inu-ọku nke obì-unu, nāgharanu idi ọ̀bọ̀; n'akuku mọ-unu, nādinu ọku; n'akuku Onye-nwe-ayi, nābunu orù;
ka unu we ghara ighọ ndi ume-ngwu, kama ka unu we buru ndi nēṅomi ndi ahu ndi ji okwukwe na ogologo-ntachi-obi nēketa nkwa ahu.