6 Ọnu-ya nākpọ kwa iti-ihe òkù.
6 Egbugbere ọnụ ndị nzuzu na-ebutere ha esemokwu, ọnụ ha na-ebutere ha ihe otiti.
Onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya, n'otù ubọchi ahu ka anāmara iwe anākpasu ya: Ma onye nēkpuchi nlelì ka onye nwere ezi uche bu.
Nání na nganga ka ilu-ọ̀gù nāputa: Ma n'aka ndi aduworo ọdu ka amam-ihe di.
Onye mara ihe nātu egwu, we si n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya: Ma onye-nzuzu nēwebiga iwe ókè, we nātukwasi obi.
N'ọnu onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ka ome npako di: Ma eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi mara ihe gēdebe ha.
Dika mb͕e madu nērùpu miri, otú a ka isi-nmalite ise-okwu di: N'ihi ya tutu ilu-ọ̀gù esie ike rapu ya.
Onye oké ọnuma ganāra nra: N'ihi na ọ buru na i naputa ya, i gēme kwa ya ọzọ.
Edoziworo ndi nākwa emò ikpé di iche iche, Ọ bu kwa iti-ihe di iche iche ka edoziworo nye azu ndi-nzuzu.
Ọ buru madu nsọpuru ikwusi ilu ọ̀gù: Ma onye ọ bula nke uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ganālusi ọ̀gù ike.
Chupu onye nākwa emò, ise-okwu gāpu kwa; E, iru-uka na nlelì gākwusi.
Ọ di nma inọkwasi na nkuku elu ulo, Kari inọyere nwayi nēse okwu n'ulo bùru ibù.
Nkume di arọ́, ájá bu kwa ibú; Ma nkpasu-iwe nke onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ di arọ́ kari ha abua.
Ọ buru na onye mara ihe esoro onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ kpe ikpe, Ma o nwere ọnuma ma ọ chìri ọchì, izu-ike adighi kwa.