Josef we hu umu-nne-ya, ọ mata ha, ma ọ mere onwe-ya dika onye ala ọzọ n'ebe ha nọ, ọ we kpayere ha uka ike, si ha, Òle ebe unu si bia? Ha si, Site n'ala Kenean izuru ihe-oriri.
N'ihi na ihe nile ndia ka akam meworo, ihe ndia nile ewe di, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: ma onye a ka M'gēlegide, ọbuná onye ewedara n'ala nke etib͕u-kwa-ra mọ-ya etib͕u, onye nāma kwa jijiji n'okwum.
ọ buru kwa na unu ele onye ahu nke nēyi uwe mara nma nke-uku anya, si, Gi onwe-gi nọdu ala n'ebe a nke-ọma; unu we si ob͕eye ahu, Gi onwe-gi guzo n'ebe a, ma-ọbu nọdu ala n'okpuru ihe-nb͕akwasi-ukwum;
ọ si, Biko, ka m>chikọta ihe, kpokọta kwa ihe n>etiti #ukw#u-ọka n>azu ndi n=eb#i ọka: o we bia, guzogide site na mb͕e ututu we rue ub͕u a, ma ub͕u a ọ n=anọdu n>ulo nwa mb͕e.
Ọ gēru kwa, na onye ọ bula nke fọduru n'ulo-gi gābia ikpọ isi ala nye ya n'ihi ego ntà nke ọla-ọcha na ob͕e achicha, ọ gāsi kwa, Biko, tiyem n'otù uzọ ọlu-nchu-àjà, ka m'we rie iberibe achicha.
Ma ub͕u a mara hu kwa ihe i gēme; n'ihi na ezubesiri ihe ọjọ ike megide onye-nwe-ayi, megide kwa ulo-ya nile: ma ya onwe-ya bu nwoke jọb͕uru onwe-ya, nke madu nāpughi igwa ya okwu.