Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 18:10 - Bible Nso

10 Ulo-elu di ike ka aha Jehova bu: Nime ya ka onye ezi omume nāb͕abà, o we nọ n'elu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Aha Onyenwe anyị bụ ụlọ elu e wusiri ike, ndị ezi omume na-agbaba nʼime ya izere ndụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 18:10
29 Iomraidhean Croise  

Mb͕e Abram b͕ara ọgu arọ anọ na iri na iteghete, Jehova mere ka Abram hu Ya anya, Ọ si ya, Mu onwem bu Chineke Nke puru ime ihe nile; gi jegharia n'irum, buru kwa onye zuru okè.


Biko, naputam n'aka nwa-nnem, n'aka Isọ: n'ihi na mu onwem nātu egwu ya, ma eleghi anya ọ gābia, tib͕ue m, tib͕ukwa nne tinyere umu-ya.


ọ we si, Jehova bu oké nkumem, na ebem ewusiri ike, na onye nēme ka m'b͕apu, Onye m'nwere;


Ọ bu Chineke nke oké nkumem, anamab͕abà nime Ya; Ọ bu ọtam, na mpi nke nzọputam, na ulo-elum, na ebe-nb͕alagam; Onye-nzọputam, I nāzọputam n'ihe-ike.


Ọ nēme ka nzọputa eze-Ya di uku: Ọ nēme-kwa-ra onye nke Ya etere manu ebere, Bú Devid, Ọ nēme-kwa-ra nkpuru-ya ebere rue mb͕e ebighi-ebi.


Eberem, na ebem ewusiri ike, Na ulo-elum, na onye m'nwere ime ka m'b͕apu; Na ọtam, na onye m'b͕abàworo nime ya; Onye nāzọda ndim n'okpurum.


Jehova bu nkumem di elu, na ebem ewusiri ike, na onye nēme ka mb͕apu; Ọ bu Chinekem, na oké nkumem, anamab͕abà nime Ya; Ọ bu ọtam, na mpi nke nzọputam, na ulo-elum.


Si n'ebe nsọ Ya zìe iye-aka-gi, Si kwa na Zaion kwagide gi;


Jehova bu ìhèm na nzọputam; ònye ka m'gātu egwu? Jehova bu ebe siri ike nke ndum; ònye ka m'gātu oké egwu?


N'ihi na ọ huwom n'anya si-ike, M'gēme kwa ka ọ b͕aputa: M'gēme ka ọ nọ n'ebe di elu, n'ihi na ọ mawo aham.


M'gāsi Jehova, I bu ebe-nb͕abàm na ebem ewusiri ike; I bu Chinekem, Onye m'nātukwasi obi.


eme-kwa-ram Abraham, me kwa Aisak, me kwa Jekob, ka ha hum anya dika Chineke Nke puru ime ihe nile, ma n'aham, bú JEHOVA, ka anēmeghi ka ha maram.


N'egwu Jehova ka ntukwasi-obi siri ike di: Umu-Ya gēnwe kwa ebe-nb͕abà.


Egwu madu nēweta ọnyà: Ma onye nātukwasi Jehova obi, agēme ka ọ nọ n'elu.


Tukwasinu obi na Jehova rue mb͕e nile ebighi-ebi: n'ihi na Ja Jehova bu oké nkume nke mb͕e nile ebighi-ebi.


N'ihi na otú a ka Ọ siri, bú Onye di elu, Nke eme-kwa-ra ka Ọ di elu, Onye nēbi ebi mb͕e nile ebighi-ebi, Onye Nsọ ka aha-Ya bu kwa: Ọ si, N'ebe di elu di kwa nsọ ka M'bi, M'biye-kwa-ra onye mọ-ya bu ihe azọpiara azọpia di kwa ala, ime ka mọ nke ndi di ume-ala n'obi di ndu, na ime ka obi nke ndi azọpiara azọpia nime mọ-ha di ndu.


N'ihi na amuworo ayi otù nwa, otù nwa-nwoke ka enyeworo ayi; ibu-onye-isi gādikwasi kwa n'ubu-ya: agākpọ kwa aha-ya Onye-ebube, Onye-ndum-ọdu, Chineke Nke bu Dike, Nna Nke bu Nna mb͕e nile ebighi-ebi, Onye-isi Udo.


N'ubọchi-ya ka agāzọputa Juda, Israel gēbi kwa na ntukwasi-obi: nka bu kwa aha-ya agākpọ ya, Jehova bu ezi omume-ayi.


Jehova, bú Onye-nwe-ayi, bu ikem, Ọ nēme kwa ukwum abua ka ha di ka ukwu ele, Ọ bu kwa n'ebem nile di elu ka Ọ gēme ka M'zọ ije. Ọ diri Onye-isi Abù, n'ubọ-akwaram nile.


Le, nwa-ab͕ọghọ ahu nāmaghi nwoke gādi ime, ọ gāmuta kwa Nwa-nwoke, Ha gākpọ kwa aha-Ya Immanuel; nke bu, ma asugharia ya, Chineke nọyere ayi.


Mu onwem bu Alfa ahu na Omega ahu, ka Onye-nwe-ayi Chineke kwuru, bú Onye nādi adi, Onye di-kwa-ri, Onye nābia kwa, Onye puru ime ihe nile.


Devid we si onye Filistia ahu, Gi onwe-gi nēwere mma-agha, were kwa ube, were kwa nkpunkpu ube, biakutem: ma mu onwem nēwere aha Jehova nke usu nile nke ndi-agha biakute gi, bú Chineke nke usoro-agha nile nke Israel, Onye i taworo uta.


Devid we nọ na nkpà nke-uku; n'ihi na ndi-ya siri ka ha were nkume tub͕ue ya, n'ihi na nkpuru-obi ndi-ya nile di ilu, nwoke ọ bula n'ihi umu-ya ndikom na n'ihi umu-ya ndinyom: ma Devid mere onwe-ya ka ọ di ike nime Jehova, bú Chineke-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan