Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 17:27 - Bible Nso

27 Onye nēb͕ochi okwu-ọnu-ya mara ihe-ọmuma: Ọzọ, onye mọ-ya juru ajuru bu onye-nghọta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 Nwoke ahụ na-adịghị ekwu ọtụtụ okwu bụ onye maara ihe, onye mmụọ ya dịkwa jụụ bụ onye nwere nghọta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 17:27
8 Iomraidhean Croise  

N'ọtutu okwu njehie adighi-akwusi: Ma onye nēb͕ochi eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua bu onye nwere uche.


Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ nwere ọtutu nghọta: Ma onye nwere obi ọku nēbuli uche b͕agọrọ ab͕agọ.


Obi onye ezi omume nātughari uche n'iza okwu: Ma ọnu ndi nēmebi iwu nēkwuwa ihe ọjọ di iche iche.


Ọ di nma, bú onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, kari dike: Ọ di kwa nma, bú onye nāchi mọ-ya, kari onye nēwere obodo n'agha.


Okwu nke ndi mara ihe anēkwu na nwayọ, anānu ha kari iti-nkpu nke onye nāchi achi n'etiti ndi-nzuzu.


Unu matara nka, umu-nnam ndi m'huru n'anya. Ma ka madu ọ bula buru onye nānu ihe ọsọsọ, onye nādighi ngwa ikwu okwu, nādighi kwa ngwa iwe iwe:


Ma ọ bu nkpuru nke ezi omume ka ndi nēme udo nāgha n'udo.


N'ihi na ayi nile nāsu ngọngọ n'ọtutu ihe. Ọ buru na onye ọ bula asughi ngọngọ n'okwu, onye ahu bu nwoke tozuru okè, buru kwa onye puru ikwa aru-ya dum nga.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan