25 Ihe nākpasu nna-ya iwe ka nwa nzuzu bu, Ọ bu-kwa-ra nwanyi muru ya ihe-ilu.
25 Nwa dị nzuzu na-ewetara nna ya mwute, bụrụkwa nne mụrụ ya ihe ilu.
Ewe gosi Joab, si, Le, eze nākwa ákwá, nēru-kwa-ra Absalom újú.
Ilu di iche iche nke Solomon. Nwa nke mara ihe nēme ka nna-ya ṅuria: Ma nwa di nzuzu bu iru-újú nne-ya.
Nwa nke mara ihe nēme ka nna-ya ṅuria: Ma madu nzuzu nēleda nne-ya anya.
Onye nāmu onye-nzuzu ọ gāburu ya iru-újú: Nna onye-nzuzu adighi-aṅuri kwa ọṅu.
Ila-n'iyi nile n'ebe nna-ya nọ ka nwa nzuzu bu: Ọzọ, miri-ọtutu nātu mb͕e nile ka ise-okwu nwunye bu.
Ka nna-gi na nne-gi ṅuria, Ka nwanyi muworo gi teghari kwa egwú ọṅù.
Nkpa-n'aka na iba-nba nēnye amam-ihe: Ma nwata nke anārapu n'onwe-ya nēme ka ihere me nne-ya.