Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 17:20 - Bible Nso

20 Onye obi-ya b͕agọrọ ab͕agọ adighi-achọta ezi ihe: Ọzọ, onye nāb͕anwe onwe-ya n'ire-ya gādabà n'ihe ọjọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Ọ dịghị aga nʼihu bụ onye obi ya gbagọrọ agbagọ. Onye nwere ire nrafu ga-adanye na nsogbu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 17:20
11 Iomraidhean Croise  

N'ebe onye di ọcha nọ I gēgosi Onwe-gi onye di ọcha; Ma n'ebe onye b͕agọro ab͕agọ nọ I gēgosi Onwe-gi onye-nb͕á.


Onye nēb͕u iku-anya nēnye ihe-nwuta: Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka agākwatu.


Ndi mara ihe nākpakọba ihe-ọmuma: Ma ọnu onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya bu nbibi di nso.


Ọnu onye ezi omume nāmi amam-ihe dika nkpuru: Ma ire nke nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu, agēbipu ya.


N'ihi na ọdi-n'iru agaghi-adiri onye ọjọ; Oriọna ndi nēmebi iwu gānyu.


N'ihi na ihe-árú n'anya Jehova ka onye sihiere esihie bu: Ma n'aka ndi ziri ezi ka ìzù nzuzo Ya di.


Egwu Jehova bu ikpọ ihe ọjọ asì: Npako, na nganga, na uzo ọjọ, Na ọnu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu, ka m'kpọworo asì.


Okwu nile nke ọnu onye mara ihe di amara; ma eb͕ub͕ere-ọnu nke onye-nzuzu gēloda ya onwe-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan