M'gēme kwa ulo-gi ka ọ di ka ulo Jeroboam nwa Nebat, ka ọ di kwa ka ulo Beasha nwa Ahaija, n'ihi nkpasu-iwe nke i ji kpasum iwe, me kwa ka Israel mehie.
ndi nādighi-ewere ihe ọjọ nyeghachi n'ọnọdu ihe ọjọ, ma-ọbu nkwutọ n'ọnọdu nkwutọ; ma kama nke ahu burunu ndi nāgọzi; n'ihi na ihe eji kpọ unu bu nka, ka unu we keta ngọzi.
Jonatan we gwa Sọl nna-ya okwu di nma bayere Devid, si ya, Ka eze ghara imehie megide orù-ya, bú Devid; n'ihi na o mehieghi megide gi, na n'ihi na omume-ya nile adiwo nma nke-uku n'ebe i nọ:
Ma Devid siri, Nání n'efu ka m'debeworo ihe nile nke nwoke a nwere n'ọzara, ọ dighi kwa ihe ọ bula elere anya ya na o furu efu n'ihe nile o nwere: o we nyeghachim ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe.