Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 16:22 - Bible Nso

22 Isi-iyi nke ndu ka ezi uche bu n'ebe ndi-nwe-ya nọ: Ma idọ-aka-na-nti nke ndi uche-ha b͕agọrọ ab͕agọ bu uche b͕agọrọ ab͕agọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Inwe uche bụ isi iyi ndụ nye ndị niile nwere ya, ma enweghị uche na-ewetara ndị nzuzu ntaramahụhụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 16:22
16 Iomraidhean Croise  

Isi-iyi nke ndu ka ọnu onye ezi omume bu: Ma ime-ihe-ike nēkpuchi ọnu ndi nēmebi iwu.


Iwu onye mara ihe bu isi-iyi nke ndu, Isi n'ọnyà nile nke ọnwu wezuga onwe-gi.


Egwu Jehova bu isi-iyi nke ndu, Isi n'ọnyà nile nke ọnwu wezuga onwe-gi.


Ire ndi mara ihe nēme ka ihe-ọmuma di nma: Ma ọnu ndi-nzuzu nēkwuwa okwu uche b͕agọrọ ab͕agọ.


Obi onye ezi omume nātughari uche n'iza okwu: Ma ọnu ndi nēmebi iwu nēkwuwa ihe ọjọ di iche iche.


Onye obi-ya mara ihe, agākpọ ya onye-nghọta: Ọzọ, utọ eb͕ub͕ere-ọnu nātukwasiri nmuta ihe.


Obi onye mara ihe nēme ka ọnu-ya nwe uche, Ọ nātukwasi-kwa-ra eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua nmuta.


Miri nke miri emi ka okwu nile nke ọnu madu bu; Iyi nērù erù ka isi-iyi amam-ihe bu.


Ọnu onye-nzuzu buru ya nbibi, Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua bu kwa ọnyà nkpuru-obi-ya.


Ha gābu-kwa-ra nkpuru-obi-gi ndu, Bu-kwa-ra olu-gi amara.


Rapunu ha: ha bu ndi-ndú kpuru ìsì. Ma ọ buru na onye-ìsì edu onye-ìsì, ha abua gādabà n'olùlù.


N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye nānu okwum, nke nēkwere kwa Onye ziterem, o nwere ndu ebighi-ebi, ọ biaghi kwa n'ikpé, kama o sitewo n'ọnwu ba na ndu.


Ọ bu Mọ nēme ka madu di ndu; anu-aru abaghi urù ọ bula: okwu nke Mu onwem gwaworo unu, ha bu mọ, buru kwa ndu.


Saimon Pita zara Ya, si, Onye-nwe-ayi, Ònye ka ayi gējekuru? I nwere okwu nke ndu ebighi-ebi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan