Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 16:21 - Bible Nso

21 Onye obi-ya mara ihe, agākpọ ya onye-nghọta: Ọzọ, utọ eb͕ub͕ere-ọnu nātukwasiri nmuta ihe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 A na-amata onye nwere uche site nʼụdị nghọta o nwere. Okwu dị ụtọ na-eme ka mmadụ mụta ihe nke ọma.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 16:21
18 Iomraidhean Croise  

le, emewom dika okwu-gi si di: le, enyewom i obi mara ihe na nke nāghọta ihe; ya mere ọ dighi onye dika gi buru gi uzọ nọ, ọ dighi kwa onye gēbili dika gi n'azu gi.


Emewo gi ka i ma nma kari umu madu; Awukwasiwo amara n'eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua: N'ihi ya Chineke agọziwo gi rue mb͕e ebighi-ebi.


N'eb͕ub͕ere-ọnu nke onye nāghọta ihe ka anāchọta amam-ihe: Ma nkpa-n'aka diri azu onye obi amam-ihe kọrọ.


Ọ diri onye-nzuzu dika igwuri-egwú, bú ime ihe-nzube ọjọ: Otú a ka amam-ihe di-kwa-ra onye-nghọta.


Ndi obi-ha mara ihe gānata ihe enyere n'iwu: Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka agākwatu.


Eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi mara ihe nēfesa ihe-ọmuma: Ma obi ndi-nzuzu adighi-eme otú a.


Isi-iyi nke ndu ka ezi uche bu n'ebe ndi-nwe-ya nọ: Ma idọ-aka-na-nti nke ndi uche-ha b͕agọrọ ab͕agọ bu uche b͕agọrọ ab͕agọ.


Nwam, ọ buru na obi-gi mara ihe, Obim gāṅuri, ọbuná nkem:


Manu na ihe-nsure-ọku nke nēsi ísì utọ nēme ka obi ṅuria: Otú a ka utọ eyì madu di nke sitere na ndum-ọdu nke nkpuru-obi.


Onye-nkpọkọta chọrọ ichọputa okwu nile nātọ utọ, na ihe edeziri edezi, bú okwu nile nke ezi-okwu.


Onye-nwe-ayi, bú Jehova, enyewom ire nke ndi-nmuta, ka m'we mara iwere okwu kwagide onye dara #mbà: Ọ nākpọte ntim kwa-ututu, Ọ nākpọte ntim inu ihe dika ndi-nmuta.


Ònye bu onye-amam-ihe? ọ gāghọta kwa ihe ndia; ònye bu onye-nghọta? ọ gāma kwa ha. N'ihi na uzọ nile nke Jehova ziri ezi, ndi ezi omume gēje kwa ije nime ha; ma ndi-njehie gāsu ngọngọ nime ha.


N'oge ahu Jisus zara, si, Ekelem I, Nna, Onye-nwe elu-igwe na uwa, na I zonariri ndi-amam-ihe na ndi nwere nghọta ihe ndia, I were kwa ha kpughere umu ọhu:


Ha nile we buru ndi-àmà-Ya, okwu nile nke amara nke si n'ọnu-Ya puta nēju kwa ha nile anya: ha we si, Onye a, Ọ̀ bughi Nwa Josef?


Ndi ahu ndi nēje ozi zara, si, Ọ dighi mb͕e ọ bula madu kwuru okwu di otú a.


N'ihi na iṅa-nti-unu eruzuwo na nti madu nile. Ya mere anamaṅuri ọṅu n'isi unu: ma anamachọ ka unu buru ndi-amam-ihe n'ebe ezi ihe di, ma ndi arughi-árú n'ebe ihe ọjọ di.


Ma amam-ihe ahu nke si n'elu bia buru uzọ di ọcha, emesia ọ di udo, nwe obi-ọma, nēkweye okwu nke-ọma, juputa n'ebere na ezi nkpuru, nēnweghi obi-abua, nēnweghi iru-abua.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan