Heman we bata. Eze we si ya, Gini ka agēme nwoke ahu, bú onye nsọpuru-ya tọworo eze utọ? Heman we si n'obi-ya, Ònye ka ọ nātọ eze utọ inye nsọpuru karim?
O rue, mb͕e ya onwe-ya nākpọ isi ala n'ulo Nisrok, bú chi-ya, na Adramelek na Shareza, bú umu-ya ndikom, were mma-agha tib͕ue ya: ma ndi ahu wepugara onwe-ha la n'ala Ararat. Isa-hadon, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya.
Idi-egwu-gi, nganga nke obi-gi arafuwo gi, gi onye bi na nb͕awa nile nke nkume ahu di elu, onye nējide ebe di elu nke ugwu ntà: n'ihi na asi na i me akwu-gi ka ọ di elu dika nke ugo, M'gēme ka i si n'ebe ahu ridata; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
Obi-gi adiwo elu n'ihi ima-nma-gi, i bibiwo amam-ihe-gi n'ihi onwunwu-ìhè-gi: n'ala ka M'tudaworo gi, n'iru ndi-eze ka M'tọb͕ọworo gi n'ala, ka ha we lekwasi gi.
Ala Ijipt gāghọ kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu na nkpọnkpọ ebe; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova: n'ihi na ọ siwo, Mu nwe osimiri Nail, ọ bu kwa onwem mere ya.