Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 16:15 - Bible Nso

15 N'ìhè iru eze ka ndu di; Mb͕e ihe madu nātọ ya utọ, ọ di ka igwe-oji nke miri-ozuzo ikpe-azu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Mgbe ọchị dị nʼihu eze ọ na-ewetara onye hụrụ ya ndụ, ihuọma ya dị ka igwe ojii na-eweta mmiri ozuzo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 16:15
11 Iomraidhean Croise  

N'ihi na I nēme ya ka ọ buru ngọzi rue mb͕e ebighi-ebi: I nēwere ọṅù me ka ọ ṅuria n'iru Gi.


N'ihi na nání otù ntabi-anya nāgabiga n'iwe-Ya; Ogologo ndu nile nāgabiga na mb͕e ihe-ayi nātọ Yautọ: N'anyasi ikwa-ákwá gābia inọ ọnọdu-abali, Ma n'ututu iti-nkpu-ọṅù gādi.


Ọtutu madu nāsi, Ònye gēme ka ayi hu ọdi-nma? Jehova, bulie ìhè iru-Gi ka ọ mukwasi ayi.


Ọ gārida dika miri-ozuzo si ezokwasi n'ọzara asuru asu: Dika oké miri-ozuzo nke nēdè ala.


Ọnuma eze bu ndi-ozi ọnwu: Ma onye mara ihe gēkpuchi ya.


Ọb͕ub͕ọ-uja dika nke ọdum ka iwe di ọku nke eze bu; Ma dika igirigi n'elu ihe-ọkukú ka utọ ihe madu nātọ ya di.


Ọtutu madu nāchọ iru onye nāchi achi: Ma n'aka Jehova ka ikpé onye ọ bula nēsi bia.


Ka ayi mara kwa, ka ayi b͕aso imara Jehova; dika chi-ọbubọ, otú a ka ọpupu-Ya guzosiworo ike: Ọ gābiakute kwa ayi dika oké miri-ozuzo, dika miri-ozuzo ikpe-azu nke nēzosa ala.


Riọnu Jehova miri-ozuzo n'oge miri-ozuzo nke-ikpe-azu, ọbuná Jehova Nke nēme àmùmà; ọ bu kwa oké miri-ozuzo ka Ọ gēnye ha, nye onye ọ bula ihe-ọkukù n'ubi-ya.


I mere ka M'mara uzọ ndu; I gēji iru-Gi me ka M'juputa n'ọṅù.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan