Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 15:33 - Bible Nso

33 Egwù Jehova bu idọ-aka-na-nti nke amam-ihe; Ọ bu kwa n'iru nsọpuru ka obi ume-ala nāga.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

33 Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ amamihe na-abịa site nʼịdọ aka na ntị; onye dị umeala nʼobi ga-anata ugwu na nsọpụrụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 15:33
16 Iomraidhean Croise  

Ma mb͕e orúrú Esta, bú nwa-nwayi Abihail nwa-nne nna Mọdekai, onye kuru ya n'onwe-ya ka ọ buru nwa-ya nwayi, biaruru ibakuru eze, ọ chọghi ihe, ọ bu nání ihe Hegai, bú onozi eze, onye nēdebe ndinyom, nāsi ya. Esta we nānata amara n'anya ndi nile nāhu ya anya.


O we si madu, Le, egwu Onye-nwe-ayi, nke ahu bu amam-ihe; Ọzọ, isi n'ihe ọjọ puta bu nghọta.


Nmalite amam-ihe ka egwu Jehova bu; Ezi uche ka ndi nile nēme ha nwere: Otuto-Ya nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi.


Bianu, umum, gem nti: Egwu Jehova ka m'gēzi unu.


Ima amam-ihe na idọ-aka-na-nti; Ighọta okwu-ọnu nile nke nghọta;


Egwu Jehova bu nmalite ihe-ọmuma: Amam-ihe na idọ-aka-na-nti ka ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche ledaworo anya.


Onye nēzere idọ-aka-na-nti nāju nkpuru-obi nke aka ya: Ma onye nānu iba-nba nēnweta obi amam-ihe.


Madu nwe ido obi n'usoro: Ma n'aka Jehova ka ọziza ire sitere.


N'iru ntipia ka obi madu di elu, Ọ bu kwa n'iru nsọpuru ka obi ume-ala nāga.


Npako madu gēme ka ọ di ala: Ma onye mọ-ya di ala nējidesi nsọpuru ike.


Egwu Jehova bu ikpọ ihe ọjọ asì: Npako, na nganga, na uzo ọjọ, Na ọnu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu, ka m'kpọworo asì.


N'ihi na onye ọ bula nke nēweli onwe-ya elu, agēweda ya; ọzọ, onye nēweda onwe-ya, agēweli ya elu.


Wedanu onwe-unu n'iru Onye-nwe-ayi, Ọ gēweli kwa unu elu.


Otú ahu, unu ndi bu nwata, donu onwe-unu n'okpuru ndi-okenye. Ma unu nile were obi di ume-ala ke onwe-unu dika ákwà, ijerita ibe-unu ozi: n'ihi na Chineke nēdo Onwe-ya imegide ndi-npako, ma Ọ nēnye ndi di ume-ala n'obi amara.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan