Ma ub͕u a na mb͕e dika nwa ntabi-anya amara esitewo n'aka Jehova, bú Chineke-ayi, ime ka ndi b͕apuru ab͕apu fọduru ayi, na inye ayi otù ǹtú n'ebe nsọ Ya, ka Chineke-ayi we nye anya-ayi ìhè, na idebere ayi nwantī ndu n'ọbubu-orù-ayi.
Jehova ganēdu kwa gi mb͕e nile, me ka afọ ju nkpuru-obi-gi n'ebe nile nkpọrọ nku, Ọ gēme kwa ka ọkpukpu-gi nile di ike; i gādi kwa ha ubi ab͕ara ogige nke dere miri nke-ọma, di kwa ka ebe miri nāsuputa nke miri-ya nādighi-ata ata.
Abali agaghi-adi kwa ọzọ; ìhè oriọna na ìhè anyanwu adighi kwa ha nkpà; n'ihi na Onye-nwe-ayi Chineke gēnye ha ìhè: ha ganābu kwa eze rue mb͕e nile ebighi-ebi.