Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 15:20 - Bible Nso

20 Nwa nke mara ihe nēme ka nna-ya ṅuria: Ma madu nzuzu nēleda nne-ya anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Nwa nke maara ihe na-eme ka obi tọọ nna ya ụtọ, ma onye nzuzu na-eleda nne ya anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 15:20
14 Iomraidhean Croise  

Ọzọ kwa, otú a ka eze siri, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu, Onye nyeworom ta onye nānọkwasi n'oche-ezem, anyam nāhu kwa ya.


Ma ub͕u a agula ya n'onye ikpe nāmaghi, n'ihi na onye mara ihe ka i bu; i gāmara kwa ihe i gēme ya, ma i gēme ka isi-awọ-ya rida n'ala-mọ n'ọbara.


O rue, mb͕e Hairam nuru okwu nile nke Solomon, na ọ ṅuriri ọṅu nke-uku, si, Onye agọziri agọzi ka Jehova bu ta, Onye nyeworo Devid nwa mara ihe ibu onye-isi ndi uku a.


Sọpuru nna-gi na nne-gi: ka ubọchi-gi we di anya n'elu ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.


Ilu di iche iche nke Solomon. Nwa nke mara ihe nēme ka nna-ya ṅuria: Ma nwa di nzuzu bu iru-újú nne-ya.


Nwa nke mara ihe nānu idọ-aka-na-nti nna-ya: Ma onye nākwa emò anughi ibasi-nba-ike.


Uzọ onye-ume-ngwu di ka ogige ogwu: Ma okporo-uzo ndi ziri ezi bu uzọ atuliri atuli.


Ge nna-gi, bú onye muru gi, nti, Eleda-kwa-la nne-gi anya mb͕e o mere agadi.


Nna nke onye ezi omume gēteghari egwú ọṅù nke-uku: Onye nāmu kwa onye mara ihe gāṅuri ọṅu na ya.


Onye ọ bula nke nāhu amam-ihe n'anya nēme ka nna-ya ṅuria: Ma onye bu eyì nke ndinyom nākwa iko nāla àkù-ya n'iyì.


Anya nke nākwa nna-ya emò, Nke nēleda kwa iṅa nne-ya nti, Ugolo-ọma nke ndagwurugwu gāghuputa ya, Umu-ugo gēri kwa ya.


Unu gātu egwu, onye ọ bula ọ tua egwu nne-ya na nna-ya, unu gēdebe kwa ubọchi-izu-ikem nile: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.


Ma unu mara ọnwunwa-ya, na, dika nwa nēso nna-ya, otú a ka o sorom buru orù n'izisa ozi ọma.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan