Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 15:2 - Bible Nso

2 Ire ndi mara ihe nēme ka ihe-ọmuma di nma: Ma ọnu ndi-nzuzu nēkwuwa okwu uche b͕agọrọ ab͕agọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ire onye maara ihe na-eme ka ihe ọmụma mụbaa, ma ọnụ onye nzuzu na-ekwupụta okwu enweghị uche.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 15:2
14 Iomraidhean Croise  

Obim ab͕ọputawo okwu di nma: Mu onwem nēkwu okwu; olum diri eze: Irem bu pen nke onye nēde akwukwọ ngwa ngwa.


Le, ha ji ọnu-ha nāsuputa okwu; Mma-agha di n'eb͕ub͕ere-ọnu-ha: N'ihi na ònye nānu? bu ihe ha kwuru.


Madu nke nwere ezi uche nēkpuchi ihe-ọmuma: Ma obi ndi-nzuzu nākpọsa uche b͕agọrọ ab͕agọ.


Onye ọ bula nke nwere ezi uche ji ihe-ọmuma alu ọlu: Ma onye-nzuzu nāb͕asa uche b͕agọrọ ab͕agọ.


Ọṅù diri onye ọ bula n'ọziza-okwu nke ọnu-ya: Ọzọ, okwu ekwuru na mb͕e-ya, le ka o si di nma nke-uku!


Obi onye ezi omume nātughari uche n'iza okwu: Ma ọnu ndi nēmebi iwu nēkwuwa ihe ọjọ di iche iche.


Eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi mara ihe nēfesa ihe-ọmuma: Ma obi ndi-nzuzu adighi-eme otú a.


Obi onye mara ihe nēme ka ọnu-ya nwe uche, Ọ nātukwasi-kwa-ra eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua nmuta.


Ka i we debe ìzùzù di iche iche, Ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi we chebe kwa ihe-ọmuma.


Onye-nzuzu nēme kwa ka okwu ba uba: madu adighi-ama ihe ọ bula nke gādi adi; ọzọ, ihe gādi mb͕e ọ gasiri, ònye gēgosi ya?


N'ihi na nrọ abiawo n'ọtutu ije-ozi, olu onye-nzuzu kwa n'ọtutu okwu.


Onye-nwe-ayi, bú Jehova, enyewom ire nke ndi-nmuta, ka m'we mara iwere okwu kwagide onye dara #mbà: Ọ nākpọte ntim kwa-ututu, Ọ nākpọte ntim inu ihe dika ndi-nmuta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan