Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 15:10 - Bible Nso

10 Idọ-aka-na-nti ọjọ diri onye nārapu uzọ: Onye nākpọ iba-nba asì gānwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Oke ịdọ aka na ntị na-echere ndị na-ahapụ ụzọ. Onye kpọrọ ịba mba asị ga-anwụ ọnwụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 15:10
20 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e Ehab huru Elaija, na Ehab siri ya, Ọ̀ bu gi bu nka, gi onye nēmekpa Israel aru?


Ehab we si Elaija, Ì chọtawom, onye-irom? Ọ si, Achọtawom i: n'ihi na i rewo onwe-gi ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova.


Eze Israel we si Jehoshafat, Otù nwoke ọzọ di kwa iju Jehova ase n'aka-ya, bú Maikaia nwa Imla: ma mu onwem kpọrọ ya asì; n'ihi na ọ dighi-ebu amuma ezi ihe bayerem, kama ihe ọjọ. Jehoshafat we si, Ka eze ghara ikwu otú a.


N'ihi na ha esiwo n'iso Ya wezuga onwe-ha, Ha eweghi kwa uche le uzọ-Ya nile anya:


Ebe gi onwe-gi kpọworo idọ-aka-na-nti asì, We tufue okwum nile n'azu gi.


Unu we wezuga ndum-ọdum nile, Unu achọghi kwa iba-nbam:


Ha achọghi ndum-ọdum; Ha lelìri iba-nbam nile:


Uzọ iru na ndu ka onye nēdebe idọ-aka-na-nti bu: Ma onye nārapu iba-nba nēme ka madu kpafue.


Onye nāhu idọ-aka-na-nti n'anya nāhu ihe-ọmuma n'anya: Ma onye nākpọ iba-nba asì bu anu-ọhia.


Nwa nke mara ihe nānu idọ-aka-na-nti nna-ya: Ma onye nākwa emò anughi ibasi-nba-ike.


Ala-mọ na ebe-ila-n'iyì di n'iru Jehova? Òbi umu madu gēsi aṅa ghara idi n'iru Ya?


Ihe-árú n'anya Jehova ka uzọ onye nēmebi iwu bu: Ma onye nāb͕aso ezi omume ka Ọ nāhu n'anya.


Ha etib͕uwom, ka i gāsi, ariaghm ọria; Ha apiawom ihe, amaghm: Òle mb͕e m'gēteta? m'gāchọ kwa ya ọzọ.


I we si, Le ka m'siworo kpọ idọ-aka-na-nti asì nke-uku, Ọ bu kwa iba-nba ka obim leliworo anya;


Ọ̀ bughi nka ka i nēmere onwe-gi, n'irapu Jehova, bú Chineke-gi, mb͕e Ọ nēme ka i je ije n'uzọ?


Ma gi onwe-gi, mb͕e i gādọ onye nēmebi iwu aka na nti ka o si n'uzọ-ya puta ka o we si nime ya chigharia, ma o sighi n'uzọ-ya chigharia; onye ahu gānwu n'ajọ omume-ya, ma gi onwe-gi, nkpuru-obi-gi ka i naputaworo.


N'ihi na onye ọ bula nke nēme ihe nādighi nma nākpọ Ìhè ahu asì, ọ dighi-abiakute kwa Ìhè ahu, ka aghara itu ya ọlu-ya nile n'anya.


Uwa apughi ikpọ unu asì; ma ọ nākpọ Mu onwem asì, n'ihi na Mu onwem nāb͕ara ya àmà, na ọlu-ya nile jọrọ njọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan