1 Ọziza-okwu di nrò nēme ka ọnuma laghachi azu: Ma okwu nwuta nākpali iwe.
1 Ọsịsa okwu dị nro na-eme ka iwe na ọnụma laa azụ; ma okwu ike na-akpali iwe.
Ndikom Israel we za ndikom Juda, si, Òkè iri ka ayi nwere n'eze, ọzọ kwa, ayi nwere òkè nime Devid kari unu: gini me-kwa-ra unu lelìri ayi anya, ka okwu-ayi ghara ibu uzọ n'ime ka eze-ayi lata? Ma okwu ndikom Juda siri ike kari okwu ndikom Israel.
Ha we gwa ya okwu, si, Ọ buru na i ghọrọ ndi nka orù ta, we fè ha òfùfè, za ha, gwa ha okwu di nma, ha gāghọ-kwa-ra gi orù ubọchi nile.
Ha we gwa ya okwu, si, Ọ buru na i ghọrọ ndi nka onye ọma, ihe-ha we tọ gi utọ, i we gwa ha okwu di nma, ha gāghọ-kwa-ra gi orù ubọchi nile.
Ọ̀ gāriọ gi ọtutu aririọ-amara? Ma-ọbu ọ̀ gāgwa gi okwu di nrò?
Ikpọ-asì nākpọte ise-okwu di iche iche: Ma njehie nile ka ihu-n'anya nēkpuchi.
Onye-ọnuma nākpali ise-okwu: Ma onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ nēme ka ilu-ọ̀gù di jū.
Site n'eweghi iwe ọsọsọ ka anāràye onye-isi, Ire nrò nānyaji kwa ọkpukpu.
Onye nkpuru-obi-ya di nganga nākpali ise-okwu: Ma onye nātukwasi Jehova obi, agēme, ya ka ọ ma abuba.
Onye-iwe nākpali ise-okwu, Ọzọ, onye nēnwe ọnuma ri nne nējehie ri nne.
Ndi nākwa emò nāfuye ọku n'obodo: Ma ndi mara ihe nēme ka iwe laghachi azu.
Mb͕e o kwusiri okwu ndia, o we zilaga nzukọ ahu.