Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 14:35 - Bible Nso

35 Ihe orù nwere uche nātọ eze utọ: Ma nrubiga-ókè nke iwe-Ya gādi n'aru onye nēweta ihere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

35 Eze na-aṅụrị ọṅụ nʼihi odibo maara ihe; ma odibo na-eweta ihere na-akpali oke iwe ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 14:35
18 Iomraidhean Croise  

Fero we si ndi-orù-ya, Àyi gāchọta madu dika onye a, bú nwoke nke mọ Chineke di nime ya?


Eze we si n'ọṅuṅu manya-vine bilie n'ọnuma-ya je n'ubi ab͕ara ogige nke ulo-ya: ma Heman guzoro ichọ ndu-ya n'aka Esta, bú nwunye eze; n'ihi na ọ huru na eze zubesiri ihe ọjọ ike megide ya.


Onye nēkpokọta na mb͕e okpom-ọku bu nwa nēnwe uche: Ma onye nāraru ura n'owuwe-ihe-ubi bu nwa nēweta ihere.


Ezi omume nēbuli mba: Ma ihe-ihere nke ndi nile di iche iche ka nmehie bu.


Ihe nātọ ndi-eze utọ ka eb͕ub͕ere-ọnu ezi omume bu; Ọ bu kwa onye nēkwu ihe ziri ezi ka ha nāhu n'anya.


Orù nke nwere uche gāchi nwa madu nēweta ihere, Ọ bu kwa n'etiti umu-nne nwa ahu ka ọ gēkere ihe-nketa.


Onye nāpunara nna-ya ihe, nke nēme kwa ka nne-ya b͕alaga, Bu nwa nēweta ihere nēme kwa ka enwe iru-ihere.


Ọ nāfuchapu ndi nēmebi iwu, bú eze mara ihe, Ọ nēme kwa ka wheel nsucha-ọka laghachi n'elu ha.


Eze nke nānọkwasi n'oche ikpé Ji anya-ya abua afuchapu ihe ọjọ nile.


Onye nāhu idi-ọcha nke obi n'anya, Eyì-ya ka eze gābu n'ihi amara nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua.


Wepu onye nēmebi iwu n'iru eze, Oche-eze-ya ewe guzosie ike n'ezi omume.


Ọ buru na onye nāchi achi aṅa nti okwu-ugha, Ndi nile nējere ya ozi bu ndi nēmebi iwu.


Onye-nwe-ya siri ya, I mere nke-ọma, ezi orù nke kwesiri ka atukwasi gi obi: i kwesiri ka atukwasi gi obi n'umu ihe ole-na-ole, m'gēme gi onye-isi ọtutu ihe: ba n'ọṅù nke onye-nwe-gi.


Onye-nwe-ya siri ya, I mere nke-ọma, ezi orù nke kwesiri ka atukwasi gi obi; i kwesiri ka atukwasi gi obi n'umu ihe ole-na-ole, m'gēme gi onye-isi ọtutu ihe: ba n'ọṅù nke onye-nwe-gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan