34 Ezi omume nēbuli mba: Ma ihe-ihere nke ndi nile di iche iche ka nmehie bu.
34 Ezi omume na-ewuli mba elu, ma mmehie bụ ihe ihere nye ndị ọbụla.
N'ihi na Jehova mere ka Juda ruru ala, n'ihi Ehaz, bú eze Israel; n'ihi na o mere ka Juda ghara idi nchikọta, o we mekpu emekpu nke-uku megide Jehova.
Ala nke nāmi nkpuru ka ọ ghọ ala nnú nnú, Site n'ihe ọjọ nke ndi bi nime ya nēme.
N'obi onye-nghọta ka amam-ihe nānọgide: Ma n'etiti ndi-nzuzu ka ọ nēme ka amara ya.
Ihe orù nwere uche nātọ eze utọ: Ma nrubiga-ókè nke iwe-Ya gādi n'aru onye nēweta ihere.
Eze nēji ikpé ziri ezi eme ka ala-ya guzo: Ma onye nānara onyinye nākwada ya.
Mb͕e Efraim jiri ima-jijiji kwu okwu, ya onwe-ya buliri onwe-ya elu n'Israel: ma ikpe mara ya nime Beal, o we nwua.