Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 14:31 - Bible Nso

31 Onye nēmeb͕u onye nēnweghi ike nāta Onye kèworo ya uta: Ma onye nāsọpuru Ya ka onye nēme ob͕eye amara bu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

31 Onye ọbụla na-emegbu onye ogbenye na-elelị Chineke kere ha anya, ma onye na-emere onye ogbenye ebere na-asọpụrụ Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 14:31
19 Iomraidhean Croise  

Ha nēsi n'uzọ wezuga ndi-ob͕eye: Ndi ewedara n'ala nke uwa ezobekowo onwe-ha n'otù.


N'ihi ipunara ndi ewedara n'ala ihe, n'ihi isu-ude nke ndi-ob͕eye, Ub͕u a ka M'gēbili, ka Jehova kwuru; M'gēdo ya na nzọputa nke o nēkusi ume ike inwe.


Onye nēleda madu-ibe-ya anya nēmehie: Ma onye nēmere ndi ewedara n'ala amara, onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu.


Onye nākwa ob͕eye emò atawo Onye meworo ya uta: Onye nāṅuri ọṅu bayere nhuju-anya ndi ọzọ, agaghi-agu ya n'onye nēmeghi ihe ọjọ.


Onye nēbinye Jehova ihe ka onye nēmere onye nēnweghi ike amara bu, Ọ bu kwa nmeso ọma ya ka Ọ gākwughachi ya.


Onye nēmeb͕u onye nēnweghi ike ime ka àkù nke aka ya ba uba, Ya na onye nēnye ọgaranya ihe gābiaru nání ihe-ukọ.


Ọgaranya na ob͕eye ezutewo: Onye meworo ha nile bu Jehova.


Onye nēme ka àkù-ya ba uba site n'inara uma na ọmuru-nwa, Ọ nēkpokọta ya nye onye nēmere ndi nēnweghi ike amara.


Ọ buru na i hu na anēmeb͕u ob͕eye, na anānapu kwa ikpé ziri ezi na ezi omume n'ike n'ala anāchi achi, ibobo anwula gi n'ihe ahu anēme: n'ihi na otù Onye Nke di elu kari onye di elu nāriba ama; ndi di elu di kwa n'elu ha.


Unu emerita-kwa-la onwe-unu ihe-ike; ma i gātu egwu Chineke-gi: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi.


Ọzọ, mb͕e nwa-nne-gi gāda ob͕eye, aka-ya ewe ghara idi ike n'ebe-obibi-gi; i gēye-kwa-ra ya aka: dika ọbìa na onye-nnọdu ka ọ gābu, o gēbiyere kwa gi.


N'ihi na unu nwere ndi-ob͕eye n'etiti unu mb͕e nile; ma unu enweghi Mu onwem mb͕e nile.


Emeb͕ula onye egoro ọlu nke bu onye ewedera n'ala na ob͕eye, ma o sitere n'umu-nne-gi, ma-ọbu na o sitere na ndi-ọbìa-gi ndi nọ n'ala-gi nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula.


Ihe a enyere n'iwu ka ayi nwe-kwa-ra site n'ebe Ọ nọ, ka onye nāhu Chineke n'anya, ka ọ hu kwa nwa-nna-ya n'anya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan