Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 14:22 - Bible Nso

22 Hà adighi-akpafu, bú ndi nēchèputa ihe ọjọ? Ma ebere na ezi-okwu gādiri ndi nēchèputa ezi ihe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Ndị na-ezube ihe ọjọọ, ha ọ naghị akpafu? Ma ndị na-ezube ihe ọma na-achọta ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 14:22
19 Iomraidhean Croise  

si, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke onye-nwem Abraham, bu, Onye nārapughi ebere-Ya na ezi-okwu-Ya n'ebe onye-nwem nọ: mu onwem, n'uzọ ka Jehova duworom rue ulo umu-nne onye-nwem.


Jehova we si Devid, bú nnam, N'ihi na ọ di n'obi-gi iwuru aham ulo, i mere nke-ọma na ọ di n'obi-gi:


Okporo-uzọ nile nke Jehova bu ebere na ezi-okwu N'ebe ndi nēchezi ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ihe-àmà-Ya nile nọ.


Ajọ ihe ka ọ nēchè n'elu ihe-ndina-ya; Ọ nēguzo onwe-ya n'uzọ nke nādighi nma; Ọ dighi-aju ihe ọjọ.


O gēbi n'iru Chineke rue mb͕e ebighi-ebi: Wezuga ebere na ezi-okwu, ka ha we nēchezi ya.


Ezi madu gēnweputa n'aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ: Ma onye nzube ọjọ ka Ọ gāma ikpe.


Onye ezi omume nēgosi madu-ibe-ya uzọ: Ma uzọ ndi nēmebi iwu nēme ka ha kpafue.


Onye nēwe iwe ọsọsọ gēme ihe nke uche b͕agọrọ ab͕agọ: Ọzọ, onye ọbula nke nēzu nzube ọjọ di iche iche, anākpọ ya asì.


Na ndọb͕u nile nke madu nādọb͕u onwe-ya n'ọlu urù di ya: Ma okwu eb͕ub͕ere-ọnu nēdubà nání n'ihe-ikọ-ukọ.


Ihe nēme ka anāchọsi madu ike bu ebere-ya: Ọzọ, ob͕eye di nma kari onye-okwu-ugha.


Onye nēchè ime ihe ọjọ, Ya ka agākpọ onye-nwe nzube ọjọ nile.


Echèputala ihe ọjọ megide madu-ibe-gi, Ebe onye ahu nēbi gi nso na ntukwasi-obi.


Ekwela ka ebere na ezi-okwu rapu gi: Ke ha n'olu-gi; De ha n'elu mbadamba nkume, bú obi-gi:


Ib͕akuta Chineke azu di n'obi-ya, ọ nēchèputa ihe ọjọ na mb͕e nile: Ọ nēzisa ise-okwu.


Ahuhu diri ndi nēchèputa ajọ ihe, nālu kwa ihe ọjọ n'elu ihe-ndina-ha! n'ìhè nke ututu ka ha nēme ya, n'ihi na ọ di n'ike aka-ha.


Ngọzi nādiri ndi-ebere: n'ihi na ndi ahu ka agēmere ebere.


N'ihi na esitere n'aka Moses nye iwu Chineke; amara na ezi-okwu sitere n'aka Jisus Kraist bia.


Ndikom ahu we si ya, Ndu-ayi lara ndu-unu ka ayi we nwua, ma ọ buru na unu egosighi okwu-ayi nka; ọ gēru kwa, mb͕e Jehova gēnye ayi ala nka, na ayi gēmere gi ebere na ezi-okwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan