Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 14:17 - Bible Nso

17 Onye nēwe iwe ọsọsọ gēme ihe nke uche b͕agọrọ ab͕agọ: Ọzọ, onye ọbula nke nēzu nzube ọjọ di iche iche, anākpọ ya asì.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Onye iwe ọkụ na-eme ihe nzuzu, ma onye na-echepụta nzube ọjọọ ka a na-akpọ asị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 14:17
18 Iomraidhean Croise  

Abana na Fapa, bú osimiri Damaskọs, hà adighi nma kari miri Israel nile? #m'gaghi-asa aru nime ha, di ọcha? O we chigharia, laba n'ọnuma.


O we buru ihe-nleda-anya n'anya-ya iseti aka megide Mọdekai, nání ya; n'ihi na ha gosiri ya ndi Mọdekai: Heman we chọ ikpochapu ndi-Ju nile ndi nọ n'ala-eze nile nke Ahasuerọs, bú ndi Mọdekai.


Onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya, n'otù ubọchi ahu ka anāmara iwe anākpasu ya: Ma onye nēkpuchi nlelì ka onye nwere ezi uche bu.


Ezi madu gēnweputa n'aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ: Ma onye nzube ọjọ ka Ọ gāma ikpe.


Onye mara ihe nātu egwu, we si n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya: Ma onye-nzuzu nēwebiga iwe ókè, we nātukwasi obi.


Ndi nēnweghi uche eketawo uche b͕agọrọ ab͕agọ: Ma ndi nwere ezi uche ka anēkpube ihe-ọmuma n'isi.


Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ nwere ọtutu nghọta: Ma onye nwere obi ọku nēbuli uche b͕agọrọ ab͕agọ.


Onye-ọnuma nākpali ise-okwu: Ma onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ nēme ka ilu-ọ̀gù di jū.


Ọ di nma, bú onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, kari dike: Ọ di kwa nma, bú onye nāchi mọ-ya, kari onye nēwere obodo n'agha.


Ọ buru madu nsọpuru ikwusi ilu ọ̀gù: Ma onye ọ bula nke uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ganālusi ọ̀gù ike.


Gi na onye-iwe abula eyì; I gaghi-eso kwa onye-ọnuma ba n'ulo:


Onye-iwe nākpali ise-okwu, Ọzọ, onye nēnwe ọnuma ri nne nējehie ri nne.


Na obi nke nēchèputa èchìchè ajọ ihe, Na ukwu nēme ngwa ib͕aga n'ihe ọjọ;


Ekwela ka akpasue gi iwe ọsọsọ nime mọ-gi: n'ihi na nkpasu-iwe nwere ọnọdu-ya n'obi ndi-nzuzu.


Ihe-ọlu nile nke onye-aghughọ jọ-kwa-ra njọ: onye ahu ezubewo ihe-nzube ọjọ di iche iche iji okwu-ọnu nile nke bu okwu-ugha mebie ndi ewedara n'ala, ọbuná mb͕e ob͕eye nēkwu okwu ikpé ziri ezi.


Unu matara nka, umu-nnam ndi m'huru n'anya. Ma ka madu ọ bula buru onye nānu ihe ọsọsọ, onye nādighi ngwa ikwu okwu, nādighi kwa ngwa iwe iwe:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan