Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 13:9 - Bible Nso

9 Ìhè ndi ezi omume nāṅuri ọṅu: Ma oriọna ndi nēmebi iwu gānyu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Ìhè onye ezi omume na-enwupụ enwupụ, ma oriọna onye mmebi iwu ga-anyụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 13:9
16 Iomraidhean Croise  

Ma nwa-ya ka M'gēnye otù ebo, ka Devid, bú orùm, we nwe oriọna ubọchi nile n'irum na Jerusalem, bú obodo nke M'rọputaworo Onwem itiye aham n'ebe ahu.


Ùb͕ò ole ka anēmenyu oriọna ndi nēmebi iwu? Ùb͕ò ole ka nhuju-anya-ha nābiakwasi ha? Ùb͕ò ole ka Chineke nēkesa ihe-nb͕u n'iwe-Ya?


Mb͕e o nēnwu n'elu isim, bú oriọna-Ya, Ìhè-Ya ka m'nēji eje ije n'ọchichiri;


Ihè awaliwo n'ọchichiri nye ndi ziri ezi: Ọ bu onye-amara, na onye nwere obi-ebere, na onye ezi omume.


Aghaworo onye ezi omume ìhè dika nkpuru, Aghawo-kwa-ra ndi ziri ezi n'obi ọṅù.


Nání na nganga ka ilu-ọ̀gù nāputa: Ma n'aka ndi aduworo ọdu ka amam-ihe di.


Ihe-nb͕aputa nke ndu onye ọ bula bu àkù-ya: Ma ob͕eye anughi ibasi-nba-ike.


Onye nākọcha nna-ya ma-ọbu nne-ya, Oriọna-ya gānyu na nb͕achi nke ọchichiri.


N'ihi na ọdi-n'iru agaghi-adiri onye ọjọ; Oriọna ndi nēmebi iwu gānyu.


Ma okporo-uzọ ndi ezi omume di ka ìhè nēnwu enwu, Nke nāmu aga n'iru n'iru rue mb͕e chi bọchara.


Mb͕e M'nēmenyu gi, M'gēkpuchi elu-igwe, me ka kpakpando nile ha jie nji; anyanwu ka M'gēkpuchi n'igwe-oji, ọnwa agaghi-enye kwa ìhè-ya.


N'ìhi gini ka agāgupu aha nna-ayi n'etiti ab͕uru-ya, n'ihi na o nweghi nwa-nwoke? Nye ayi ihe-onwunwe n'etiti umu-nne-nna-ayi ndikom.


Mb͕e ahu eze ahu siri ndi nējere ya ozi, Kenu ya ukwu na aka, tupu ya n'ọchichiri nke èzí; n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi.


Ndi-nzuzu we si ndi nwere uche, Nye ayi ufọdu na manu-unu; n'ihi na ọwa-ayi nānyu anyu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan