Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 13:12 - Bible Nso

12 Nchere anēchere ogologo mb͕e di anya nēme ka obi nāria ọria: Ma osisi nke nēnye ndu ka ihe anāchọsi ike bu, mb͕e ọ biaruworo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Nchere a na-echere ogologo oge maka imezu olileanya e nwere na-egbu obi, mgbe ihe a na-eche mezuru, oke ọṅụ na-adị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 13:12
20 Iomraidhean Croise  

Israel we si Josef, Ka m'nwua ub͕u a, mb͕e m'husiri iru-gi, na i nọ ndu rue ub͕u a.


Eze we sim, Gini mere iru-gi jọrọ njọ, ma gi onwe-gi adighi-aria ọria? nka abughi ihe ọzọ, ọ bu nání obi jọrọ njọ. M'we tua egwu ri nne nke-uku.


Zam ngwa ngwa, Jehova; mọm agwusiwo: Ezonarilam iru-Gi; Ka m'we ghara iyi ndi nārida n'olùlù.


Mu onwem, n'ezi omume ka m'gāhu iru-Gi: Ka afọ jum n'udi gi, mb͕e m'tetara.


Adọb͕uwom onwem n'ọlu n'ikpọ-òkùm; akpiri akpọsiwom nku: Anyam abua adalawo n'isi, mb͕e m'nēchere Chinekem.


Nkpuru onye ezi omume nāmi bu osisi nēnye ndu; Onye nēnwetara Chineke nkpuru-obi madu ka onye mara ihe bu.


Àkù nke sitere n'ihe-efu gēbilata: Ma onye ji aka-ya achikọta ihe gāba uba.


Onye nēleda okwu Chineke anya nēmebi onwe-ya: Ma onye nātu egwu ihe enyere n'iwu, onye ahu ka agākwughachi ugwọ.


Mb͕e ihe anāchọsi ike mere ọ nātọ nkpuru-obi utọ: Ma ọ bu ihe-árú n'anya ndi-nzuzu isi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ha.


Osisi nēnye ndu ka ọ buru ndi nējide ya aka: E, onye ọ bula nke nējisi ya aka ike bu onye ihe nāgara nke-ọma.


Ab͕awom unu iyi, unu umu-ndinyom Jerusalem, ọ buru na unu ahu onye ihe-ya nātọm utọ, Gini ka unu gēgosi ya? Na onye ọria ihu-n'anya nāria ka m'bu.


Ya mere unu onwe-unu nēnwe kwa ihe-nwuta ub͕u a: ma M'gāhu unu ọzọ, obi-unu gāṅuri kwa ọṅu, ọ dighi kwa onye ọ bula gānara unu ọṅù-unu.


Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist. Onye nēmeri emeri, ya ka M'gēkweye ka o rie nkpuru si n'osisi nke ndu ahu puta, bú nke di na Paradais nke Chineke.


n'etiti amá-ya. N'akuku a na n'akuku nke-ọzọ nke osimiri ahu ka osisi nke ndu di kwa, nāmi uzọ nkpuru iri na abua, nēnye nkpuru-ya n'ọnwa n'ọnwa: akwukwọ osisi ahu bu ihe ime ka aru di mba nile ike.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan