7 Asi na ekpùe ndi nēmebi iwu iru, ha anọghi kwa: Ma ulo ndi ezi omume gēguzo.
7 Ndị na-emebi iwu ga-ala nʼiyi, ma ndị ezi omume ga-eguzosi ike.
Ma ulo-gi na ala-eze-gi gēkwesi ntukwasi-obi n'iru gi rue mb͕e ebighi-ebi: agēme ka oche-eze-gi buru ihe guzosiri ike rue mb͕e ebighi-ebi.
Ka aha-Gi di kwa uku rue mb͕e ebighi-ebi, si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu Chineke Israel: agēme kwa ka ulo orù-Gi, bú Devid, guzosie ike n'iru Gi.
Eze we si ka eme ya otú a: ewe nye iwu nime Shushan; ha we kwuba umu-ndikom iri nke Heman.
Ma anya ndi nēmebi iwu gādala n'isi, Ebe-nb͕alaga alanariowo kwa ha n'iyì, Nkubì-ume bu kwa olile-anya-ha.
N'ihi ya Ọ nāmata ọlu nile ha; O we nēkpù ha iru n'abali, ewe zọpia ha.
Ma ọ fọduru nwa mb͕e, onye nēmebi iwu agaghi-adi kwa: I gēlekwasi kwa ọnọdu-ya anya, ma ọ gaghi-anọ.
Mb͕e oké ifufe nēfebiga, onye nēmebi iwu anọghi kwa: Ma onye ezi omume bu ntọ-ala ebighi-ebi.
Site n'aka rue aka, agaghi-agu onye ọjọ n'onye nēmeghi ihe ọjọ: Ma nkpuru ndi ezi omume gēwepuga onwe-ha.
Dika ezi uche-ya si di ka agēto onye ọ bula: Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'obi gāghọ onye anēleda.
Nwanyi ọ bula nke mara ihe ewuwo ulo-ya: Ma nwanyi nke b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ji aka-ya abua akwada ya.
Ulo nke ndi nēmebi iwu, agēme ka ọ tọb͕orọ n'efu: Ma ulo-ikwū nke ndi ziri ezi gāma akwukwọ dika ihe akuku aku.
Ulo ndi-npako ka Jehova gēropu: Ma Ọ gēme ka ókè-ala nwanyi di-ya nwuru guzosie ike.