Ọ nyeghi ego-ya inara uma, Ọ naraghi kwa ihe-iri-ngo megide onye nēmeghi ihe ọjọ. Onye nēme ihe ndia, agaghi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya rue mb͕e ebighi-ebi.
Ọ dighi madu ọ bula nwere ike n'aru mọ ib͕ochi mọ; ọ dighi kwa ike o nwere n'aru ubọchi ọnwu; ọ dighi kwa nzilaga di n'agha ahu: nmebi-iwu agaghi-eme ka onye-nwe-ya wepuga onwe-ya.
buru kwa ndi b͕agideworo nkpọrọgwu nime Ya, ndi anēwuli kwa elu dika ulo nime Ya, ndi anēwere kwa okwukwe-unu me ka unu guzosie ike, dika ezíri unu, nēkelebiga ókè.
ihe agọziri agọzi ka ezi uche-gi bu kwa, onye agọziri agọzi ka i bu kwa, onye b͕ochiworom ta ka m'ghara ibà n'ikpe-ọmuma ọbara, ka akam ghara kwa izọputam.