Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 12:25 - Bible Nso

25 Ncheb͕u n'obi madu nēme ka obi ruru ala; Ma okwu ọma nēme ka ọ ṅuria.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 Obi nke jupụtara na nchegbu na-ada mba, ma okwu ọma na-eme ka obi ṅụrịa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 12:25
19 Iomraidhean Croise  

Ab͕agọrọm ab͕agọ ruda kwa nke-uku; Ogologo ubọchi nile ka m'jeghariworo nēyi uwe-nkpe.


Gini mere i ji ruda n'ala, nkpuru-obim? Gini mere i ji su ude nke-uku nimem? Chere Chineke: n'ihi na m'agēkele kwa Ya ọzọ, Onye bu nzọputa nke irum, na Chinekem.


O nwere onye nēkwu okwu nēchèghi echè dika ndupú nke mma-agha: Ma ire ndi mara ihe bu ihe nāgwọ madu.


Onye ezi omume nēgosi madu-ibe-ya uzọ: Ma uzọ ndi nēmebi iwu nēme ka ha kpafue.


Obi mara ilu nke aka ya; Ọ bu kwa n'ọṅù-ya ka onye nke nābughi nke ya nādighi-agwakọta onwe-ya.


Obi nke nāṅuri ọṅu nēme ka iru di nma: Ma eji ihe-nwuta nke obi tib͕ue mọ madu.


Ubọchi nile nke onye ewedara n'ala jọrọ njọ: Ma onye obi-ya di nma nēri oké oriri mb͕e nile.


Ọṅù diri onye ọ bula n'ọziza-okwu nke ọnu-ya: Ọzọ, okwu ekwuru na mb͕e-ya, le ka o si di nma nke-uku!


Ihe nke nēnye anya ìhè nēme ka obi ṅuria: Ezi ihe anuru anu nēme ka ọkpukpu nile ma abuba.


Ub͕ub͕ọ-manu-aṅu ka okwu-ọnu utọ nile bu, Nke nātọ nkpuru-obi utọ, buru kwa ihe nāgwọ ọkpukpu n'ọria.


Obi nke nāṅuri ọṅu nēme ka aru di nma: Ma mọ madu nke etib͕uru etib͕u nāmikọ ọkpukpu.


Mọ madu gānagide ọria-ya; Ma mọ madu nke etib͕uru etib͕u, ònye gēburu ya?


Nkpuru-osisi apple ọla-edo nime nkata ọla-ọcha Ka okwu ekwuru na mb͕e kwesiri ya bu.


Manu na ihe-nsure-ọku nke nēsi ísì utọ nēme ka obi ṅuria: Otú a ka utọ eyì madu di nke sitere na ndum-ọdu nke nkpuru-obi.


Onye-nwe-ayi, bú Jehova, enyewom ire nke ndi-nmuta, ka m'we mara iwere okwu kwagide onye dara #mbà: Ọ nākpọte ntim kwa-ututu, Ọ nākpọte ntim inu ihe dika ndi-nmuta.


Jehova we za mọ-ozi nke nāgwam okwu okwu ọma di iche iche, bú okwu nkasi-obi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan