Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 12:21 - Bible Nso

21 Ọ dighi ajọ ihe ọ bula gādakwasi onye ezi omume: Ma ndi nēmebi iwu ejuputawo n'ihe ọjọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Ihe ọjọọ anaghị adakwasị onye ezi omume, ma ndị ajọ omume enwetala nsogbu ebe ọ dị ukwuu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 12:21
17 Iomraidhean Croise  

Jehova gēdebe gi ka ihe ọjọ ọ bula ghara idakwasi gi; Ọ gēdebe nkpuru-obi-gi.


Ihe ọjọ agaghi-adakwasi gi, Ihe-otiti agaghi-abiaru kwa nso ulo-ikwū-gi.


Ha gēri kwa ufọdu nime nkpuru nke uzọ-ha, Ọ bu kwa ndum-ọdu nile nke aka ha gēju ha afọ.


Ma onye nēgem nti gēbi na ntukwasi-obi, Ọ gānọ kwa jū nātughi oké egwu ihe ọjọ.


Site n'aka rue aka, agaghi-agu onye ọjọ n'onye nēmeghi ihe ọjọ: Ma nkpuru ndi ezi omume gēwepuga onwe-ha.


Aghughọ di n'obi ndi nēchèputa ihe ọjọ: Ma ndi nādu ọdu udo nwere ọṅù.


Site n'uzọ nile nke aka ya ka afọ gēju onye laghachiworo azu n'obi: Ma ọ bu site n'onwe-ya ka afọ gēju ezi madu.


Egwu Jehova nēdubà na ndu: Onye nwe-kwa-ra ya, ọ gānọ n'afọ-ojuju; Ihe ọjọ agaghi-eleta ya.


Ọ di nma ka i jide nka; ọzọ kwa, esepula aka-gi na nka: n'ihi na onye nātu egwu Chineke gāputa n'etiti ha nile.


Onye nēdebe ihe enyere n'iwu agaghi-ama ihe ọjọ; ọzọ, mb͕e na ikpé ka obi onye mara ihe nāmata.


Afọ ihere ejuwo i kari nsọpuru: ṅua, ọbuná gi onwe-gi, ghọ onye anēbìghi úgwù: iko aka-nri Jehova gēchighari rue gi aru, ihere nke jọb͕uru onwe-ya gādi kwa n'elu ebube-gi.


Ma ayi matara na ihe nile nālukọ ọlu iwetara ndi huru Chineke n'anya ezi ihe, bú ndi akpọrọ dika ihe O nēzube si di.


N'ihi na nkpab͕u-ayi nke di nfé, nke di na nwa oge a, nāluputara ayi ebube nke-uku ri nne kachasi ihe nile, bú ebube nke di arọ́ di kwa ebighi-ebi;


Ọ̀nye bu kwa onye ahu nke gēmejọ unu, ma o buru na unu ghọro ndi nānu ọku n'obi n'iso ezi ihe?


Nyeghachinu ya ọbuná dika ya onye-ya nyeghachiri madu, nye-kwa-nu ya okpukpu abua dika ọlu-ya nile di: nime iko ahu ọ kwara akwa, kwaranu ya okpukpu abua.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan