Ma mu onwem, anukpọghm ipu n'iso Gi n'izù aturu; ọzọ, ubọchi nādighi ngwọta, achọsighm ya ike; Gi onwe-gi mara: ihe si n'eb͕ub͕ere-ọnum puta, na ncherita-iru Gi ka ọ diworo.
Ma eze abua ndia, obi-ha gādi n'ime ihe ọjọ, ọ bu kwa n'otù table ka ha gēkwu okwu-ugha: ma ọ gaghi-aga nke-ọma; n'ihi na ọgwugwu fọduru idi na mb͕e akara àkà.
ọbuná ya onwe-ya gēwu ulo uku Jehova; ọ bu kwa ya onwe-ya gēburu ebube nile, nọdu nāchi n'oche-eze-ya; otù onye-nchu-àjà gādi kwa n'oche-eze-ya: ndum-ọdu udo gādi kwa n'etiti ha abua.