Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 12:13 - Bible Nso

13 Na njehie nke eb͕ub͕ere-ọnu ka ọnyà onye ọjọ di: Ma onye ezi omume gēsi n'ahuhu puta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 A na-ejide onye ajọ omume site nʼokwu ọnụ ya, ma onye ezi omume na-esi na nsogbu wezuga onwe ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 12:13
21 Iomraidhean Croise  

Mọ-ozi ahu Nke nāb͕aputam n'aka ihe ọjọ nile, Ya gọzie umu-okoro ndia; ka akpọ kwa n'isi ha aha nkem, na aha nnam-hà, bú Abraham na Aisak; ka ha ba kwa uba rue ọtutu madu n'etiti uwa.


Devid we za Rikab na Beana nwa-nne-ya, bú umu Rimon onye Beirot, si ha, Jehova nādi ndu, Onye b͕aputaworo nkpuru-obim na nkpab͕u nile,


Eze, bú Solomon, we were Jehova ṅua iyi, si, Chineke mem otú a, mekwam ihe ọzọ otú a, asi na ọ bughi imegide ndu-ya ka Adonaija kwuworo okwu a.


Ha di ọtutu, bú ihe ọjọ nke nādakwasi onye ezi omume: Ma n'aka ha nile ka Jehova nānaputa ya.


Ọ nēdebe ọkpukpu-ya nile: Ọ dighi otù nime ha nyajiri anyaji.


I gēme ka ndi nile nēkwu okwu-ugha la n'iyì: Madu nke bu onye-ọbara na onye- aghughọ, Jehova nākpọ ya onye-árú.


Nmehie nke ọnu-ha ka okwu nke eb͕ub͕ere-ọnu-ha bu; Ka anwude kwa ha nime npako-ha, Na n'ihi ọb͕ub͕a-iyi na n'ihi okwu-ugha nke ha nākọ akukọ-ha.


Me ka ha gwusia n'ọnuma-Gi, me ka ha gwusia, ka ha ghara idi ọzọ: Ka ha mara kwa na Chineke nāchi achi nime Jekob, Rue nsọtu nile nke uwa. Selah


Ewe me ka ha su ngọngọ, ebe ire nke aka ha nēmegide ha: Ha nēfufe isi, bú onye ọ bula nke nēlekwasi ha anya.


Ndi obi-ha mara ihe gānata ihe enyere n'iwu: Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka agākwatu.


Adọputawo onye ezi omume n'ahuhu, Onye nēmebi iwu ba n'ọnọdu ya.


Ire ndi mara ihe nēme ka ihe-ọmuma di nma: Ma ọnu ndi-nzuzu nēkwuwa okwu uche b͕agọrọ ab͕agọ.


Ọnwu na ndu di ire n'aka; Ọzọ, ndi nāhu ya n'anya gēri nkpuru-ya.


Onye nēdebe ọnu-ya na ire-ya Nēdebe nkpuru-obi-ya ka ọ pua n'ahuhu nile.


Ejiwo okwu nile nke ọnu-gi ma gi n'ọnyà, Ejiwo okwu nile nke ọnu-gi nwude gi.


Ọ di nma ka i jide nka; ọzọ kwa, esepula aka-gi na nka: n'ihi na onye nātu egwu Chineke gāputa n'etiti ha nile.


Eze we kwue, ha we me ka ndikom ahu bia, bú ndi borori Daniel ebubo, ọ bu kwa n'olùlù ọdum ka ha tubàra ha na umu-ha na ndi bu nwunye-ha; ha akēruteghi kwa ala olùlù ahu tutu ọdum enwe ike n'aru ha, tapia ọkpukpu-ha nile.


Ndi-Ju nile we za, si, Ọbara-Ya di ayi n'isi, di kwa n'isi umu-ayi.


Onye-nwe-ayi matara idọputa ha n'ọnwunwa, bú ndi nāsọpuru Chineke, na idebe ndi ajọ omume n'ahuhu-nmehie rue ubọchi ikpé;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan