Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 11:30 - Bible Nso

30 Nkpuru onye ezi omume nāmi bu osisi nēnye ndu; Onye nēnwetara Chineke nkpuru-obi madu ka onye mara ihe bu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

30 Mkpụrụ nke ndị ezi omume bụ osisi na-enye ndụ, onye na-erita mkpụrụobi nʼuru bụ onye maara ihe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 11:30
13 Iomraidhean Croise  

Ha gānọ nāmi nkpuru n'isi-awọ; Osisi nke miri di ha n'aru ri nne, nke nwezu-kwa-ra akwukwọ ndu, ka ha gābu.


Onye nēmebi iwu achọsiwo ọnyà ndi ọjọ ike: Ma nkpọrọgwu ndi ezi omume nāmi nkpuru.


Onye nānaputa nkpuru-obi di iche iche ka onye-àmà nke nēkwu ezi-okwu bu: Ma onye nēkupu ọtutu okwu-ugha dika ume nāghọ aghughọ.


Ire nke nāgwọ madu bu osisi nēnye ndu: Ma omume b͕agọrọ ab͕agọ nime ya bu ntipia nime mọ madu.


Osisi nēnye ndu ka ọ buru ndi nējide ya aka: E, onye ọ bula nke nējisi ya aka ike bu onye ihe nāgara nke-ọma.


Ma ndi ahu ndi nwere uche ganēnwu ọcha dika onwunwu-ọcha nke mbara-ígwé; ndi nēme ọra madu ka ha ghọ ndi ezi omume ganāmu kwa dika kpakpando rue mb͕e nile ebighi-ebi.


O we si ha, Bianu som n'azu, M'gēme unu ndi-ọkù nākuta madu.


Onye nēwere ihe ubi nānara ugwọ-ọlu-ya, nāchikọta kwa nkpuru nye na ndu ebighi-ebi; ka onye nāgha nkpuru na onye nēwere ihe ubi we ṅuria ọṅu n'otù.


N'ihi na gini bu olile-anya-ayi, ma-ọbu ọṅù-ayi, ma-ọbu okpu-eze nke inya-isi ayi? Ọ̀ bughi kwa unu onwe-unu, n'iru Onye-nwe-ayi Jisus n'ọbibia-Ya?


ka ọ mara na onye meworo ka onye-nmehie si na njehie nke uzọ-ya chigharia gazọputa nkpuru-obi n'ọnwu, o gēkpuchi kwa ọtutu nmehie.


Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist. Onye nēmeri emeri, ya ka M'gēkweye ka o rie nkpuru si n'osisi nke ndu ahu puta, bú nke di na Paradais nke Chineke.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan