Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 11:20 - Bible Nso

20 Ihe-árú n'anya Jehova ka ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'obi bu: Ma ihe nātọ Ya utọ ka ndi zuru okè n'uzọ-ha bu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Onyenwe anyị na-akpọ ndị obi ha gbagọrọ agbagọ asị ma ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta na-amasị ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 11:20
20 Iomraidhean Croise  

Chinekem, ama-kwa-ram na Gi onwe-gi nānwaputa obi, izi-ezi nātọ kwa Gi utọ. Mu onwem, n'izi-ezi obim ka m'were afọ-ofufo nye Gi ihe nile ndia: ma ub͕u a ndi-gi, ndi ahutara n'ebe a, ewerewom ọṅù hu ha ka ha nēwere afọ-ofufo nye Gi onwe-ha.


Obi b͕agọro ab͕agọ gēsi n'ebe m'nọ wezuga onwe-ya: Ọ dighi onye ọjọ m'gāmara.


N'ihi na onye ezi omume ka Jehova bu; ezi omume ka Ọ huru n'anya: Ndi ziri ezi gāhu iru-ya.


Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi zuru okè n'uzọ Jehova bu, Ndi nējeghari n'iwu jehova.


N'ezie ndi ezi omume gēkele aha-Gi: Ndi ziri ezi gēbi n'iru Gi.


Le, ezi-okwu n'akuku nile di nime madu atọwo Gi utọ: Ọ bu kwa n'akuku zoro ezo ka i nēme ka m'mara amam-ihe.


Site n'aka rue aka, agaghi-agu onye ọjọ n'onye nēmeghi ihe ọjọ: Ma nkpuru ndi ezi omume gēwepuga onwe-ha.


Ihe-árú n'anya Jehova ka eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha bu: Ma ndi ji ezi-okwu eme ihe bu ndi ihe-ha nātọ Ya utọ.


Ezi omume nēchebe onye zuru okè n'uzọ: Ma nmebi-iwu nēme ka onye-nmehie kpùe iru.


Ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha, ikpe-ọmuma nākwa emò ha: Ma n'etiti ndi ziri ezi ka ihe nātọ Chineke utọ di.


Ihe-árú n'anya Jehova ka èchìchè ọjọ nile bu: Ma okwu-ọnu utọ nile di ọcha.


Àjà ndi nēmebi iwu bu ihe-árú n'anya Jehova: Ma ekpere ndi ziri ezi bu ihe nātọ Ya utọ.


Uzọ atuliri atuli nke ndi ziri ezi bu isi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ha: Onye nēdebe nkpuru-obi-ya nēche uzọ-ya.


Onye nēmebi iwu emewo ka iru-ya sie ike: Ma onye ziri ezi, onye ahu nēdozi uzọ-ya nile.


N'ihi na ihe-árú n'anya Jehova ka onye sihiere esihie bu: Ma n'aka ndi ziri ezi ka ìzù nzuzo Ya di.


Ib͕akuta Chineke azu di n'obi-ya, ọ nēchèputa ihe ọjọ na mb͕e nile: Ọ nēzisa ise-okwu.


Egwu Jehova bu ikpọ ihe ọjọ asì: Npako, na nganga, na uzo ọjọ, Na ọnu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu, ka m'kpọworo asì.


Onye nādọ onye nākwa emò aka na nti nēwetara onwe-ya nlelì: Ọzọ, onye nābara onye nēmebi iwu nba nēwetara onwe-ya ọlu-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan