Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 10:8 - Bible Nso

8 Ndi obi-ha mara ihe gānata ihe enyere n'iwu: Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka agākwatu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Onye obi ya maara ihe na-anabata ihe e nyere nʼiwu, ma onye nzuzu ekwurekwu ga-ala nʼiyi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 10:8
15 Iomraidhean Croise  

Me ka m'ghọta ihe, m'gēchebe kwa iwu-Gi; M'gēwere kwa obim nile debe ya.


Ka onye mara ihe we nu, we tukwasi ihe-nmuta n'amam-ihe-ya; Ka onye-nghọta we nweta kwa ezi ndum-ọdu:


Onye nēb͕u iku-anya nēnye ihe-nwuta: Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka agākwatu.


Ndi mara ihe nākpakọba ihe-ọmuma: Ma ọnu onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya bu nbibi di nso.


Onye nāhu idọ-aka-na-nti n'anya nāhu ihe-ọmuma n'anya: Ma onye nākpọ iba-nba asì bu anu-ọhia.


Na njehie nke eb͕ub͕ere-ọnu ka ọnyà onye ọjọ di: Ma onye ezi omume gēsi n'ahuhu puta.


Onye nēche ọnu-ya nche nēdebe ndu-ya: Ma onye nāsaghepu eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua, nbibi gādiri ya.


Na ndọb͕u nile nke madu nādọb͕u onwe-ya n'ọlu urù di ya: Ma okwu eb͕ub͕ere-ọnu nēdubà nání n'ihe-ikọ-ukọ.


Amam-ihe onye nwere ezi uche bu ighọta uzọ-ya: Ma uche b͕agọrọ ab͕agọ nke ndi-nzuzu bu aghughọ.


Abarala onye nākwa emò nba, ka o we ghara ikpọ gi asì: Bara onye mara ihe nba, ọ gāhu kwa gi n'anya.


Nye onye mara ihe nmuta, ọ gāmara kwa ihe kari: Me ka onye ezi omume mara ihe, ọ gātukwasi ihe-nmuta n'amam-ihe-ya.


Okwu nile nke ọnu onye mara ihe di amara; ma eb͕ub͕ere-ọnu nke onye-nzuzu gēloda ya onwe-ya.


Ònye bu onye-amam-ihe nke nāghọta kwa ihe n'etiti unu? ya site n'ibi-obi ọma ya gosi ọlu-ya nile nime idi-nwayọ nke amam-ihe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan