Hezekaia we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ha we lìe ya n'ebe-nrigo nke ílì umu Devid. Juda nile na ndi bi na Jerusalem we mere ya ihe-nsọpuru n'ọnwu-ya. Manase nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.
N'uzọ di otú a m'hu-kwa-ra ndi nēmebi iwu ka elìri ha, ha we ba n'ílì; ha we si n'ebe nsọ la, ewe chezọ ha n'obodo ebe ha mere otú a: nka bu kwa ihe-efu.
M'gēbili kwa megide ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), M'gēbipu kwa na Babilon aha na ndi fọduru, na umu na umu umu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
olile-anya Israel, ka Jehova bu, ihere gēme ndi nile nārapu Gi: ndi nēsi n'ebe M'nọ wezuga onwe-ha, n'ala ka agēde ha, n'ihi na ha arapuwo isi-iyi nke miri nēnye ndu, bú Jehova.