Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 10:7 - Bible Nso

7 Ncheta anēcheta onye ezi omume bu ihe-ngọzi: Ma aha ndi nēmebi iwu gēre ure.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Aha onye ezi omume ka eji enye ngọzị, ma aha onye ajọ omume ga-ere ure.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 10:7
20 Iomraidhean Croise  

Ma nwa-ya ka M'gēnye otù ebo, ka Devid, bú orùm, we nwe oriọna ubọchi nile n'irum na Jerusalem, bú obodo nke M'rọputaworo Onwem itiye aham n'ebe ahu.


M'gēb͕ochi kwa obodo a izọputa ya, n'ihi Onwem, na n'ihi Devid, bú orùm.


Ha we lìe ya n'obodo Devid n'etiti ndi-eze, n'ihi na o mere ezi ihe n'Israel, na n'ebe Chineke na ulo-Ya di.


Hezekaia we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ha we lìe ya n'ebe-nrigo nke ílì umu Devid. Juda nile na ndi bi na Jerusalem we mere ya ihe-nsọpuru n'ọnwu-ya. Manase nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.


Ncheta-ya alawo n'iyì pua n'uwa, Ọ dighi kwa aha ọ gēnwe n'èzí.


Àkpà-nwa gēchezọ ya, aru-ya gātọ ikpuru utọ n'oriri; Agaghi-echeta kwa ya ọzọ: Agānyaji kwa ajọ omume dika osisi.


Madu gākuru ya aka, Ma ya ọsọ chupu ya n'ọnọdu-ya.


Ka eriri-umu-ya diri nbipu; N'ọb͕ọ soro ha ka ehichapu aha-ha.


Ka ha di n'iru Jehova mb͕e nile, Ka O we bipu ncheta-ha n'uwa.


N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi agaghi-ewezuga ya n'onọdu-ya: Ihe-ncheta ebighi-ebi ka onye ezi omume gābu.


Iru Jehova nēmegide ndi nēme ihe ọjọ, Ibipu ncheta-ha n'uwa.


Ndi ezi omume tiri nkpu, Jehova we nuru, We si na nkpab͕u-ha nile naputa ha.


Ndi-irom nēkwu ihe ọjọ bayerem, si. Òle mb͕e ọ gānwu, aha-ya ewe la n'iyì?


Ihe anārọputa ka ezi aha bu kari ọtutu àkù, Amara di kwa nma kari ọla-ọcha na ọla-edo.


N'uzọ di otú a m'hu-kwa-ra ndi nēmebi iwu ka elìri ha, ha we ba n'ílì; ha we si n'ebe nsọ la, ewe chezọ ha n'obodo ebe ha mere otú a: nka bu kwa ihe-efu.


M'gēbili kwa megide ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), M'gēbipu kwa na Babilon aha na ndi fọduru, na umu na umu umu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


olile-anya Israel, ka Jehova bu, ihere gēme ndi nile nārapu Gi: ndi nēsi n'ebe M'nọ wezuga onwe-ha, n'ala ka agēde ha, n'ihi na ha arapuwo isi-iyi nke miri nēnye ndu, bú Jehova.


Ma n'ezie asim unu, Ebe ọ bula agēkwusa ozi ọma nka n'uwa dum, agēkwuta kwa ihe nke nwanyi a mere, ka ọ buru ihe-ncheta-ya.


N'ihi na O lere ọnọdu di ala nke orù-Ya nwanyi anya: N'ihi na le, site n'ub͕u a ọb͕ọ nile gākpọm onye ngọzi diri.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan