Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 10:28 - Bible Nso

28 Nchere ndi ezi omume gābu ọṅù: Ma olile-anya ndi nēmebi iwu gāla n'iyì.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

28 Olileanya ndị ezi omume ga-abụ ọṅụ; olileanya ndị na-emebi iwu bụ naanị ihe efu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 10:28
15 Iomraidhean Croise  

Ma anya ndi nēmebi iwu gādala n'isi, Ebe-nb͕alaga alanariowo kwa ha n'iyì, Nkubì-ume bu kwa olile-anya-ha.


Otú a ka okporo-uzọ ndi nile nēchezọ Chineke si di; Olile-anya nke onye emeruru emeru gāla n'iyì:


Onye nēmebi iwu gāhu ya, ewe kpasue ya iwe; Ọ gāta ikekere-ezé, b͕aze kwa: Ọchichọ ndi nēmebi iwu nāchọsi ike gāla n'iyì.


N'ihi nka obim aṅuriwo ọṅu, nsọpurum eteghariwo kwa egwú ọṅù: Ọzọ anu-arum gēbi na ntukwasi-obi.


Bùkuenu Chineke abù, bùkuenu aha-Ya abù ọma: Tulierenu Ya uzọ, bú Onye nānọkwasi inyinya gabiga n'ala ihe nādighi; Aha-Ya bu JA; ṅuri-kwa-nu ọṅu-agha n'iru Ya.


Ihe ndi ezi omume nāchọsi ike bu nání ezi ihe: Ma olile-anya nke ndi nēmebi iwu bu nrubiga-ókè nke iwe.


Mb͕e madu nke nēmebi iwu nwuru, olile-anya-ya gāla n'iyì: Ọzọ, nchere nke ajọ ihe nile alawo n'iyì.


Anenupu onye nēmebi iwu n'ihe ọjọ ya: Ma onye nwere ebe-nb͕abà n'ọnwu-ya ka onye ezi omume bu.


Na njehie onye ọjọ ka ọnyà di: Ma onye ezi omume nēti nkpu ọṅù nāṅuri kwa.


n'akuku olile-anya-unu, nāṅurinu ọṅu; n'akuku nkpab͕u-unu, nēnwenu ntachi-obi; n'akuku ekpere-unu, nānọgidesinu ike;


Ma Chineke nke olile-anya ahu mejue unu n'ọṅù nile na udo nile n'ikwe-ekwe, ka unu we nwebiga olile-anya ahu ókè, n'ike Mọ Nsọ.


Onye ayi sitewo-kwa-ra n'aka-Ya nwe nkpọbata-ayi n'okwukwe-ayi nime amara nka ayi nēguzo nime ya; ayi nānya kwa isi, nādabere n'olile-anya nke otuto Chineke.


Ma ka Ya onwe-ya, bú Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na Chineke, bú Nna-ayi, Onye huru ayi n'anya nye kwa ayi nkasi-obi ebighi-ebi na ezi olile-anya nime amara,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan