Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 10:25 - Bible Nso

25 Mb͕e oké ifufe nēfebiga, onye nēmebi iwu anọghi kwa: Ma onye ezi omume bu ntọ-ala ebighi-ebi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 Mgbe oke ifufe na-emebi ihe, ndị na-emebi iwu ka ọ na-eburu; ma ndị ezi omume na-eguzosi ike ruo ebighị ebi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 10:25
20 Iomraidhean Croise  

Ma onye ezi omume gējisi ike n'iso uzọ-ya, Onye nke aka-ya abua di ọcha ganāga n'iru n'iru n'inwe ume.


Dika nrọ ka ọ gēfelaga, agaghi-achọta kwa ya: Agēme kwa ka o fepu dika ọhù abali.


Ùb͕ò ole ka ha di ka ahihia-ọka n'iru ifufe, Na dika ib͕ob͕o-ọka nke oké ifufe nēzupu dika onye-ori?


Ndi nātukwasi Jehova obi Dika ugwu Zaion, nke anādighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya, kama rue mb͕e ebighi-ebi ka ọ nādigide.


Ọ nyeghi ego-ya inara uma, Ọ naraghi kwa ihe-iri-ngo megide onye nēmeghi ihe ọjọ. Onye nēme ihe ndia, agaghi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya rue mb͕e ebighi-ebi.


Onye ezi omume gāṅuri mb͕e ọ huru ọ́bọ̀ ahu: Ọ gāsa nzọ-ukwu-ya nile n'ọbara onye nēmebi iwu.


Tutu ite-unu amata ọku ogwu, Ma ihe di ndu ma ihe di ọku, Ọ nēfepusi ha ike dika oké ifufe.


Mb͕e oké egwu-unu nābia dika ikuku siri ike, Mb͕e nhuju-anya-unu nābiaru kwa dika oké ifufe; Mb͕e ahuhu na nkpà nābiakwasi unu.


Agaghi-ewezuga onye ezi omume n'ọnọdu-ya rue mb͕e ebighi-ebi: Ma ndi nēmebi iwu agaghi-ebi n'uwa.


Madu agaghi-eguzosi ike site na nmebi-iwu: Ma nkpọrọgwu ndi ezi omume, agaghi-eropu ya.


Asi na ekpùe ndi nēmebi iwu iru, ha anọghi kwa: Ma ulo ndi ezi omume gēguzo.


E, akākughi ha dika osisi: e, akāghaghi ha dika nkpuru: e, ogwe-osisi-ha akāb͕aghi nkpọrọgwu n'ala: ọzọ kwa, O kukwasiwo ha ume, ha we kpọnwua, oké ifufe nēfepu kwa ha dika ahihia-ọka kpọrọ nku.


Ma Mu onwem si kwa gi, na gi onwe-gi bu Pita, ọ bu kwa n'elu oké nkume a ka M'gēwu nzukọm dika ulo; ọnu-uzọ nilenke Hedis agaghi-aka kwa ya n'ike.


ewu-kwa-ra unu dika ulo n'elu ntọ-ala nke bu ndi-ozi na ndi-amuma, nke isi nkume nime nkuku ntọ-ala ahu bu Kraist Jisus onwe-ya;


ka ha kpadoro onwe-ha ntọ-ala ọma nye oge gaje ibia, ka ha we jide ndu ahu nke bu ndu n'ezie.


Otú ọ di, ntọ-ala di ike nke Chineke nēguzo, ebe o nwere akàrà nka, Onye-nwe-ayi mara ndi bu nke Ya: na, Ka onye ọ bula nke nākpọ aha Onye-nwe-ayi si n'ajọ omume wezuga onwe-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan