12 Ikpọ-asì nākpọte ise-okwu di iche iche: Ma njehie nile ka ihu-n'anya nēkpuchi.
12 Ịkpọ asị na-akpali esemokwu, ma ịhụnanya na-ekpuchi mmehie niile.
Onye-ọnuma nākpali ise-okwu: Ma onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ nēme ka ilu-ọ̀gù di jū.
Onye jọb͕uru onwe-ya nēgwuputa ihe ọjọ: Ọ bu kwa n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka ihe dika ọku nāru aru di.
Onye nēkpuchi njehie nāchọ ihu-n'anya: Ma onye nēkwu okwu mb͕e na mb͕e nēkewa ezi eyì.
Onye nkpuru-obi-ya di nganga nākpali ise-okwu: Ma onye nātukwasi Jehova obi, agēme, ya ka ọ ma abuba.
Onye-iwe nākpali ise-okwu, Ọzọ, onye nēnwe ọnuma ri nne nējehie ri nne.
N'ihi na opìpì miri-ara-ehi nēweputa miri-ara raru araru, Ọzọ, opìpì imi nēweputa ọbara: Otú a ọpìpì iwe nēweputa ise-okwu.
Òle ebe ibu-agha si bia, òle ebe kwa ilu-ọ̀gù si bia, bú nke di n'etiti unu? ọ̀ bughi n'ebe ahu, bú ihe-utọ nile unu nke nēbu agha n'ihe nile di unu n'aru, ka ha si bia?
ka ọ mara na onye meworo ka onye-nmehie si na njehie nke uzọ-ya chigharia gazọputa nkpuru-obi n'ọnwu, o gēkpuchi kwa ọtutu nmehie.
nke bu isi ihe nile menu ka ihu-n'anya ahu unu nāhurita onwe-unu di ike; n'ihi na ihu-n'anya nēkpuchi ọtutu nmehie: