Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ilu 1:4 - Bible Nso

4 Inye ndi nēnweghi uche ezi uche, Inye nwa-okorọbia ihe-ọmuma na ìzùzù:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Nʼihi ime ka ndị na-enweghị uche nwee ezi uche, ka ndị na-eto eto nweta ihe ọmụma na izuzu ọma.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ilu 1:4
19 Iomraidhean Croise  

Onye nēdebe ndi nēnweghi uche ka Jehova bu: Enweghm ike, O we nyem nzọputa.


Nkpughepu okwu-Gi nile nēnye ìhè; Ọ nēmeka ndi nēnweghi uche ghọta ihe.


Gini ka okorọbia gēji me ka uzọ-ya di ọcha? Ọ bu n'ilezi ya anya dika okwu-Gi si di.


Iwu Jehova zuru okè, nēweghachi nkpuru-obi: Ihe-àmà Jehova kwesiri ntukwasi-obi, nēme ka onye nēnweghi uche mara ihe.


Bianu, umum, gem nti: Egwu Jehova ka m'gēzi unu.


Nwam, ekwela ka ha si n'anya-gi abua wezuga onwe-ha; Chebe nzube-ihe na ìzùzù;


Mu onwem, bú amam-ihe, emewo ezi uche ebe-obibim, Ọ bu kwa ọmuma ihe-ìzùzù di iche iche ka m'nāchọputa.


Mu onwem nāhu ndi ahu n'anya, bú ndi nāhum n'anya; Ọ bu kwa ndi nāchọsim ike gāchọtam.


Ma ub͕u a, umum, genum nti: N'ihi na ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēdebe uzọm nile bu.


Unu ndi nēnweghi uche, ghọtanu ezi uche; Unu ndi-nzuzu kwa, menu ka obi-unu ghọta ihe.


Ṅuria, nwa-okorọbia, na nwata i bu; ka obi-gi me kwa gi nma n'ubọchi nile nke okorọbia i bu, je kwa ije n'uzọ nile nke obi-gi, na n'ọhuhu-uzọ nke anya-gi abua: ma mara na n'ihi ihe ndia nile Chineke gēme ka i ba n'ikpé.


Uzọ atuliri atuli, ọbuná uzọ, gādi kwa n'ebe ahu, Uzọ nke idi-nsọ ka agākpọ kwa ya; onye ruru árú agaghi-agabiga na ya; ma uzọ ahu gādiri ndi ahu: onye ọ bula nke nāga n'uzọ, ọbuná ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha, ha agaghi-akpafu akpafu.


Debe-kwa-nu ha, me kwa ha; n'ihi na nka bu amam-ihe-unu na nghọta-unu n'anya ndi nile, ndi gānu ukpuru ndia nile, we si, Otú ọ di, ndi mara ihe na ndi nwere nghọta ka mba uku a bu.


Ma nāb͕anari agu ihe ọjọ nāgu nwa-okorọbia, nāb͕aso kwa ezi omume, okwukwe, ihu-n'anya, udo, gi na ndi nākpọku Onye-nwe-ayi site n'obi di ọcha.


otú ahu nāriọ umu-okorọbia ka ha nwe uche zuru okè:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan