O rue, mb͕e ọ nāgwa ya okwu, na eze siri ya, Ọ̀ bu iburu eze onye nādu ọdu ka ayi meworo gi? ra aka; n'ìhi gini ka agētib͕u gi? Onye-amuma ahu we ra aka, si, Amawom na Chineke ezubewo ibibi gi, n'ihi na i mewo nka, i geghi kwa idu-ọdum nti.
O rue, mb͕e Jehudi gusiri ibe akwukwọ atọ ma-ọbu anọ, na o ji mma ode-akwukwọ bìkasia ya, tubà ya n'ọku nke di n'ite-ọku, rue mb͕e akwukwọ-npiakọta ahu resiri n'ọku nke di n'ite-ọku.