18 Ndia Kwa, ọbara onwe-ha ka ha nēche anwu, Ha nēzobe onwe-ha inwude ndu nke aka ha.
18 Ma ndị a na-esi ọnya nke na-ama ha. Ha onwe ha ka ọnya ahụ ga-ejide.
Ha we kwuba Heman n'elu osisi nke o doziri nye Mọdekai. Ewe me ka ọnuma eze bìe.
Ma Gi onwe-gi, Chineke, gēme ka ha rida n'olùlù nbibi: Ndi bu ndi-ọbara na ndi-aghughọ agaghi-adiru nkera ubọchi-ha; Ma mu onwem gātukwasi obi na Gi.
Jehova emewo ka amara Ya onwe-ya, ezi ikpe ka O kpeworo: N'ọlu nke ọbu-aka-ya abua ka amaworo onye nēmebi iwu dika n'ọnyà. Higgaion. Selah
Ọ buru na ha asi, Soro ayi je, Ka ayi che anwu ọbara, Ka ayi zobe onwe-ayi ijide onye nēmeghi ihe ọjọ n'efu;
N'ihi na ọ bu n'efu ka anāb͕asa ub͕u, N'anya nnunu ọ bula:
Onye nēguzosi ike n'ezi omume gēru na ndu: Ma onye nāb͕aso ihe ọjọ gēru n'ọnwu nke aka ya.
Ezi omume nke onye zuru okè gēme ka uzọ-ya zie ezi: Ma nmebi-iwu nke aka ya ka onye nēmebi iwu gēji da.
Madu nke ọbara madu nānyib͕u, Rue olùlù ka ọ gāb͕alaga; ka onye ọ bula ghara ijide ya.
ma dika obi-etili-gi na obi-gi nēchègharighi si di i nākpado iwe nye onwe-gi n'ubọchi iwe na nkpughe nke ikpé ziri ezi nke Chineke;