17 N'ihi na ọ bu n'efu ka anāb͕asa ub͕u, N'anya nnunu ọ bula:
17 Ọ bụ ihe abaghị uru ịgbasa ụgbụ, nʼebe nnụnụ ọbụla na-ahụ ya anya.
Onye nēzí ayi ihe kari anu nke uwa, Ọ nēme kwa ka ayi mara ihe kari anu-ufe nke elu-igwe?
N'ihi na ukwu-ha nāb͕a ọsọ ime ihe ọjọ, Ha nēme kwa ngwa iwusi ọbara.
Ndia Kwa, ọbara onwe-ha ka ha nēche anwu, Ha nēzobe onwe-ha inwude ndu nke aka ha.
Rue mb͕e àkú gēji b͕apue imeju-ya; Dika nnunu si eme ngwa ibà n'ib͕udu, Ma ọ maghi na imegide ndu-ya ka ọ bu.
Ehi mara onye-nwe-ya, inyinya-ibu ma-kwa-ra ebe-ọzùzù-anu nke onye-nwe-ya: ma Israel amaghi, ndim atukwasighi uche.
Ọbuná ub͕ala n'elu-igwe mara mb͕e-ya nile akara àkà; ọzọ, nduru na eleke na okwoli nāriba mb͕e ọbibia-ha ama; ma ndim amaghi ikpé Jehova.